Life Hack: Etu e si eme akpụ site n'ugbo ruo n'efere
Igbo niile ma na akpụ bụzi eze nri, n'agbanyeghi na ọ bụ ji ka nwee ugwu.
Onye ọbụla kpọrọ onwe ya nwa afọ Igbo ma na ekwuwe okwu nri, akpụ werechaa ọnọdụ, ndị ọzọ apụtawa.
Ọ bụ mpaghara Ndịda Amerịka ka akpụ si, ọ bụghị nri si mpaghara Igbo, mana o werela ọnọdụ dịka ọ bụ ebe ala Igbo ka o si.
Akụkọ a gosiri njem akpụ, site n'ugbo banye n'efere.
Onye mere akụkọ a bụ Chiagozie Nwonwu na Chiemela Peter Mgbeahuru