You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Kelechi Iheanacho: Kedụ etu o si bụrụ ụkwụ na-aghọ nkọ?
Kelechi Iheanacho chere ruo ụbọchị atọ nke ọnwa Febrụwarị iji nye goolu mbụ ya na Premier League n'afọ bọọlụ ọhụrụ a.
Kemgbe ahụ Iheanacho na-agbara Leicester City enyela goolu 12 n'ime asọmpi itoolu ọ gbarala ha.
Nwaafọ Naịjiria a na-akpọ 'senior man' haziri goolu nke mbụ ma nye nke abụọ ha ji merie Crystal Palace satara naanị otu, iji nyekwuo ha pọịntị asaa ha ji aga ndị na-eso ha n'azụ na tebulu ma nyekwuo ha ohere irute nso maka ntozu asọmpi Champions League.
Nke a egosila Iheanacho dị iche na Iheanacho chere ọnwa 14 tupu otu goolu na Premier League site n'ọnwa Septemba 2018 ruo Disemba 2019.
Ọ bụrụla onye kacharala nyere ndị Leicester City goolu na sizin a dịka o nyerela goolu 17, nke bụ kemgbe afọ 2014-2015 Jamie Vardy nọ na nsogbu ịbụ onye na-abụghị onye bu ụzọ.
"Anyị anaghị akpa maka onye ga-abụ onye kacha nye goolu," ka Iheanacho gwara BBC Sport. "Dịka otu anyị na-arụkọtara onwe anyị ọrụ, onye nyere goolu agbasaghị anyị.
"E nwere ọtụtụ ihe a ga na-agbanwe ka ọ kakwuo mma n'asọmpi anyị na-agba, ya mere m ga na-aga n'ihu, na-agbasi mbọ ike."
Brendan Rodgers bụ onye nchịkọta ya kwuru: "Kemgbe ọnwa ole na ole, Kelechi na-eme ihe dị egwu. Ọ bụghị naanị ebumnobi ya kama ọ bụkwa etu o si etinye uchu n'ọrụ, ọ chọrọ igosi ndịiche n'egwuregwu. Ọ bụghị onye okomoko ma ncha, ọ na-agbasikwa mbọ ike."
Gịnị gbanwere?
Ihe gbanwere kemgbe Iheanacho malitere ịgbara Leicester City bọọlụ, bụ na ya na Vardy na-arụkọzị n'ihu.
Naanị egwuregwu asatọ ka ha abụọ so malite n'afọ bọọlụ gara aga, mana ha abụọ agbakọghị ọnụ ọzọ n'afọ bọọlụ ọhụrụ a ruo Febrụwarị 28 - ọ bụkwanụ naanị makana James Maddison na ndị ọzọ merụrụ ahụ. Ha agbakọkwaalanụ egwuregwu ndị ọzọ ọnụ kemgbe ahụ.
Iheanacho enyela goolu 14 n'ime ugboro 14 ikpeazụ ọ gbara bọọlụ, nke bụ ole ọ kacharala nye n'ime ugboro 76 mbụ ọ gbarala ndị Leicester.
Naanị Harry Kane (nwere goolu 18) enyela goolu karịa Iheanacho (nyerela goolu 15) n'ime ndị na-agba bọọlụ na Premier League n'asọmpi niile n'afọ a.
Karen Carney gbabuuru Ịngland bọọlụ dịka ọ na-ele egwu dị n'etiti Leicester City na Crystal Palace, gwara BBC Radio 5 Live sị: "Ọ dị m ka obisiike Iheanacho abịala n'ihi na ọ ma na agaghị ewepụ ya tinye Vardy mgbe ọ na-agba bọọlụ.
"Dịka onye na-agba bọọlụ, ị ga-ahụ na ọ ga na-echekasị gị na e nwere ike ịwepụ gị n'egwu.
"Mana n'ihi na ya na Jamie Vardy na-agbakọ ọnụ, obi kara ya, otu goolu ahụ amụbanye n'abụọ na atọ."
Rodgers bụ onye nchịkọta ya kwuru: "Ihe kacha m mkpa dịka onye nchịkọta bụ inyere ndị ọgbabọọlụ aka ime ọfụma karịa etu ha dị. Ọ rara Kels ahụ n'ihi etu anyị si agbabu bọọlụ nke bụ iji naanị otu onye goolu - Jamie Vardy.
"Anyị gbanweziri ya n'ihi ndị merụrụ ahụ, chi ya efoola ugbua ọ na-aghọkwanụ nkọ. Ọ bụghị naanị goolu ọ na-enye, ọ na-enye ya aṅụrị itinye uchu n'ọrụ otu a."
Ezigbote onye goolu
Iheanacho ezila na ọ ga-enyenwu goolu nso nso a, n'ụzọ a na-anaghị ahụkarị kemgbe ọ gbawara bọọlụ.
Goolu 10 o nyere na Premier League n'afọ a agafeela goolu ndị a na-atụkarị anya n'aka ya - goolu ole a na-atụ anya na ọ ga-enye site n'ohere ndị ọ na-enweta - ji goolu atọ gafee, shọt ole ọ gbara pụtara ihe bụ nke kachasị kemgbe o sonyere Leicester City.
Kasper Schmeichel bụ oche goolu ndị Leicester City gwara Sky Sports: "Ihe gbasara inye goolu doro Kele anya ọfụma - ọ ma etu ọ ga-esi nọgharịa ma gbaa bọọlụ ozugbo, o nwere nke ọ na-eme ebe ọ na-anọgharị wee si n'etiti ụkwụ onye egwu azụ gbafere bọọlụ ma bie oche goolu aka n'ala.
"Ọ na-emekarị ya mgbe ọbụla ma anyị nọrọ n'ọzụzụ. Ikwu nke bụ eziokwu, ọ na-eyi ndị mmadụ egwu n'ọzụzụ. Ọ bụ dimkpa siri ike na-emegharịnwu ahụ, ọsọ dị ya n'ụkwụ, o nwere ihe niile mmadụ na-eji abụ ezigbote onye goolu ma na-egosikwanụ ya ugbua, nke bụ ezigbo ihe."