Zeke Nnaji: Etu m si soro na ndị ọkaibe n'egwuregwu 'Basketball'
Zeke Tobechukwu Nnaji bụ otu n'ime ndị ntorobịa a kpọpụtara aha ha dịka ndị ọkaibe n'egwuregwu bọọlụ nkata na mba Amerịka.
Ụmụ Naịjirịa asatọ so na ndị a kpọpụtara aha ha dịka ndị ga-esonye n'otu dị icheiche na "National Basketball Association".
Tobechukwu kọọrọ BBC Igbo etu o si malite ịkụ bọọlụ nkata oge ọ dị obere.
Nna Tobechukwu, bụ Afam Nnaji, gwara anyị na ya onwe ya gbakwara bọọlụ oge ọ na-eto eto, mana o jighi ya gaa n'ihu.
Ugbua, Nnaji bụzi onye nkuzi nwa ya nwoke bụ Tobechukwu.
Ha kwuru na ha na-atụ anya ịzụlite ọtụtụ ndị na-eme egwuregwu na Naịjirịa.


