Treasury House Fire: Isi ụlọọrụ 'accountant general' Naịjiria na-agba ọkụ

Ebe foto si, Twitter/@TheICIR
Isi ụlọọrụ onye ọgbakọ ego Naịjirịa bekee kpọrọ 'Accountant General' agbaala ọkụ.
Aha ọzọ a na-akpọ ụlọọrụ ahụ bụ 'Treasury House'.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ọkụ ọgbụgba a malitere n'ụtụtụ Wenezde mana amabeghi ihe kpatara ya maọbụ ebe o si malite.
Ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ gbara mbọ ọtụtụ awa tupu ha agbanyụọ ya bụ ọkụ.

Ebe foto si, Twitter/@TheICIR
Mịnịsta nta na-ahụ maka bọọjeti bụ Clem Agba ekwuola na onweghi ihe ọbụla dị mkpa mebiri n'ọkụ ọgbụgba ahụ.
Ọ gwara ndị ntaakụkọ na ha akpagharịala n'ebe ahụ ọkụ gbara mana ọ baghị n'ebe a na-edebe ihe dị mkpa.

Ebe foto si, Twitter/Agba Clem
O kwuru sị: "O nwgeghi ihe mebiri. Naanị ụmụ kịrịkịrị akwụkwọ gbara ọkụ, mana akwụkwọ ego niile anyị niile enweghị nke ọkụ metụrụ."
"Anyi ga-eleba anya ịmata ihe kpatara ọkụ ahụ. Obi dịkwa anyị ụtọ na onweghi onye nwụrụ na ya."
Bernie Sanders awụsala ọwa ịzọ ọkwa onyeisiala Amerịka

Ebe foto si, Getty Images
Onye omeiwu mba Amerịka bụ Bernie Sanders ekwuola na ya agaghịzị eso azọ ọkwa onyeisiala mba ahụ.
Ndị enyemaka Sanders kwuru nke a n'akwụkwọ ozi ha zipuru n'ehihie Wenezde.
Sanders, onye dị afọ iri asaa na asatọ, zọbukwara ọkwa onyeisiala Amerịka n'afọ 2016 ma kụọ afọ n'ala.
Onye ọbụla na-elezi anya na ọ bụ Joe Biden ga-emeri ntuliaka nke ndị pati 'Democrats' iji gaa ịma Donald Trump aka n'ihu na ntuliaka nke a ga-eme n'ọnwa Nọvemba afọ 2020.










