You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Real Madrid vs Man City: Manchester City apịala Real Madrid mgbachara ndị mmụọ
Manchester City ewerela mgbachara ndị mmụọ pịawaa Real Madrid azụ n'azụ ụlọ ha.
Ọkpụ goolu abụọ a satara otu ka Man City ji merie Madrid n'asọmpi Uefa Champions League a gbara n'abalị Wenezde.
Otu egwuregwu abụọ enweghị nke nyetere ibe ya goolu n'agba nke mbụ.
Mana Madrid bu ụzọ nyete goolu nke si n'aka Isco.
Oteghi aka, Gabriel Jesus satara ya, ebe Raheem Sterling gbatara penariti nke Kevin De Bruyne gbakpuru iji nye Man City mmeri.
Nke ka njọ bụ na Sergio Ramos natara akwụkwọ ọbara ọbara n'asọmpi a, pụtara na ọ gaghị eso n'egwu mgbe Real Madrid ga-aga be Man City.
Otu abụọ a ga-akụkọta mpi ọzọ n'ụbọchị 17 nke ọnwa Maachị nke afọ a, mgbe ha ga-ezute n'Etihad.