Boxing Day: Southampton akụọla Chelsea ihe Anthony Joshua kụrụ Ruiz

Ebe foto si, Getty Images
Taa bụ 'boxing day' adịghị ndị Chelsea mma n'ahụ dịka ndị Southampton kụwara ha anya n'azụ owere ha.
Ndị Southampton ji ọkpụ goolu abụọ gbarie 'Stamford Bridge', gbanye ndị Chelsea ose n'anya.
Nwafọ Naịjirịa bụ Michael Obafemi bụ onye buru ụzọ gbakaa neetị na nkeji 31.
Obafemi, onye gbara naanị afọ 19 bụ mba Ireland ka ọ na-agbara.
Na nkeji 73, Nathan Redmond mezuru ya abụọ wee mee ndị Chelsea otiwere anya ahụ ụzọ.

Ebe foto si, Getty Images
N'aka nke ọzọ, Mikel Arteta malitere ije ya dịka onye nkuzi ndị Arsenal taa, mana o nwetaghị mmeri.
Arsenal na ndị Bournemouth gbara onye lawa onye lawa.
Dan Gosling nke Bournemouth nyere goolu na nkeji 35, mana Pierre Emerick Aubameyang sara ya na nkeji 73.
Arteta ga-eji nke a mata na ihe chere ya n'ihu n'otu egwuregwu Arsenal abụghị ọgụ nne na-agbara nwa ya.
Manchester United akụpịala ndị Newcastle

Ebe foto si, Getty Images
Ọkpụ goolu anọ asatara otu ka ndị Manchester United ji tie ndị Newcastle mmọnwụ.
Marcus Rashford, Mason Greenwood na Anthony Martial nyere goolu anọ ahụ.
Martial nyere goolu abụọ ebe Matty Longstaff nyetaara ndị Newcastle otu goolu.

Ebe foto si, Getty Images
Ihe kacha tọọ ndị Man Utd ụtọ n'egwuregwu nke taa bụ na Paul Pogba alọghachila.
Pogba agbabeghi bọọlụ ogologo oge n'ihi ahụ o merụrụ.

Ebe foto si, Getty Images
Mana Carlo Ancelloti ji mmeri wee malite ọchịchị ya n'Everton.
Everton ji otu ọkpụ goolu merie Burnley.
Crystal Palace jikwa ọkpụ goolu abụọ a satara otu merie West Ham, ebe Aston Villa meriri Norwich 1-0.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:










