Latest Transfer News: Ebe 'ikuku' bugara ndị Nigeria na-agba bọọlụ na mba ofesi

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Dịka ndị egwuregwu bọọlụ na-achọ ịmalite afọ ọhụrụ nke 2019/2020, ụfọdụ ndị Naịjirịa esila n'otu ha gafee ọzọ.

Ka ahịa ọzụzụ na orire nke English Premier League mechiri n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Ọgọstụ 2019, ndị mmadụ chọrọ ịma ebe ndị Naịjirịa na-agba bọọlụ na mba ofesi nọ.

Ma ndị si otu mba gafee mba ọzọ, na ndị si n'otu egwuregwu dị na mba ha nọbụ banye n'ọzọ, BBC Igbo ga-agba ha n'anwụ n'akụkọ a.

Lee ndị pụrụ na ebe ha gara:

Alexander Iwobi

Iwobi so Naịjirịa gbaa asọmpi Iko Mba Afrịka ma nweta ọlanchara, si Arsenal ebe ọ gbara ihe karịrị afọ atọ na ụma gafee Everton ebe a kwụrụ nde paụnd 40 iji zụrụ ya.

John Mikel Obi

Obi wụsarala ọwa n'ịgbara Super Eagles nke Naịjirịa bọọlụ, si otu Middlesborough dị na mba Ịngland gafee otu egwuregwu Trabzonspor dị na mba Turkey oge a na-agba Iko Mba Afrịka nke 2019.

Kenneth Omeruo

Omeruo malitere ịza onye Chelsea kemgbe ha zụtara ya n'afọ 2012 mana ọ gbaghị otu mkpụrụ bọọlụ n'uwe Chelsea.

Akụkọ si n'akwụkwọ mgbasaozi Marca na-ekwu na Chelsea na CD Leganes bụ ebe Chelsea binyere ya n'afọ gara aga, ekpebiela ire ya n'ọnụ Yuro ise.

Taiwo Awoniyi

Awoniyi so n'otu egwuregwu nọbu na Liverpool ebe ọ na-agbaraghị ha bọolụ maọlị wee gafee FSV Mainz 05 dị na mba Jamini na mbinye.

Chima Akas

Akas wuru ewu maka ịnọchite anya Naịjirịa nakwa ime ọfụma n'asọmpi Africa Nations Championship (CHAN), si Kalmar dị n'obodo Swidin gafee C.F. Os Belenenses dị na mba Pọtugal.

Sodiq Fatai

Fatai si FC Paços de Ferreira gafee Chaves dịkwa na mba Pọtugal na mbinye.

Bright Enobakhare

Enobakhare nọbu Wolverhampton FC si ebe ahụ gafee Wigan Athletic na mbinye.

Ihe nkiri a ga-amasị gị: