You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nigeria vs South Africa: Ugo eberela na mgbagbu
Ndị otu egwuregwu bọọlụ Super Eagles nke Naijiria ekwuola na ha di njikere maka asọmpi nke ha na ndị ogbo ha nke mba Saut Afrịka n'agba anọ ikpeazụ nke iko mba Afrịka.
Mba Saut Afrịka gosiri na ha so n'ihe a na-eme mgbe ha gbapụrụ mba Ijipt na-agbanyeghi na ọbụ be ha ka a nọ asọ mpi 'African Cup of Nations' (AFCON) nke afọ a.
Nke a mere ka onye nchịkọta ndị Super Eagles bụ Gernot Rohr kwuo na Saut Afrịka buzi okwu akpụ n'ọnụ ugbu a.
Mana Rohr kwukwara na ndị otu ya ma ihe ha ga-eme ma ekeremgba bido.
Dịka ọ dị ugbua, ahụ zuru ndị otu Super Eagles niile oke maka asọmpi nke mgbede taa.
Mikel Obi bụ onye ndu ha agbakeela nke ọma n'ahụ o meruru mgbe Naijiria zutere Madagaska.
N'ọgbakọ ndị ntaakụkọ enwere na Cairo, Ijipt ụnyaahụ, Odịon Ighalo kwuru na ndị Saut Afrịka ma ihe ekwe na-akụ mana egwu ọbụla adịghị ndị "Super Eagles" n'ahụ.
"Asọmpi a ga-esi ike, mana anyị akwadoola nke ọma. Obi siri anyi nile ike. Ebumnuche anyị bụ ibulata iko AFCON na Naijiria."
Ihe ndị mmadụ na-ekwu
Soshal midia esorola tinye ọnụ n'okwu a dịka Nigeria 2 - 1 South Africa na-ewu.
Local Black Man na-ajụ ihe mere mpụtara a ji ewu.
Broskie sị na ọ bụ Sawụt Afrịka meriri Naịjirịa 2 - 1.
Ije Kelvin sị na Naịjirịa ga-emeri maọbụrụ na ha eyighi uwe a.
Cheta na Naijiria na Saut Afrịka ezutela onwe ha ugboro iri na anọ na mgbe gara aga.
Naijiria meriri ubgoro asaa ma Saut Afrika meriri ugboro abụọ.
Mba abụọ ahụ zutere onwe ha mgbe a na-eme nkwado maka AFCON ebe Saut Afrịka meriri Naijiria na Uyo dị na Akwa Ibom steeti.
Akụkọ ga-amasị gị: