Egypt vs South Africa: 'Ndị Ijipt ị hụrụ ugbua, ị gaghị ahụ ha anya ọzọ'

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Anya ndị otu egwuregwu South Afrịka ji wee pụta ịsọ mpi na "Africa Cup of Nations" (AFCON) na-eme ugbua pụkwara iche.

Ha kụpụrụ ndị otu egwuregwu bọọlụ Ijipt, chụlaa ha ma febanye n'agba anọ nke ikpeazụ.

Ndị Ijipt gbara mbọ na-ewebata ndị ọgba bọọlụ aghara aghara, mana Thembinkosi Lorch nara ha ụra rahụ mgbe o nyere goolu kwofere ndị Saụt Afrịka ka nkeji iri asatọ na ise gachara.

Mahmoud Trezeguet bụ onye kara ịzọ ndị Ijipt n'asọmpị ahụ, gbanyere bọọlụ n'aka onye na-eche goolu kama ịgbanye ya n'ime ọjọgọrọ goolu.

Etu ọ dị ugbua, Ijipt esorola Kamerun n'azụ dịka ndị achụpụrụla n'asọmpị AFCON 2019, ebe Saụt Afrika ga-aga Kaịrọ ebe ha na ndị Naịjirịa ga-achịpụ ya n'agba anọ nke ikpeazụ n'abalị iri nke ọnwa Julai.

Mohammed Sala anọzikwa nke a a na-eme?

Oke osisi Ijipt bụ Mohammed Salah sokwa n'asọmpị ụnyahụ mana ya bụ agha riri ya maka na akụkọ na-ekwu na o jichaghị ahụ wee bịa gba ya bụ bọọlụ.

Nke a mere ka ọ na-agbachapụ agbachapụ n'asọmpị ahụ dịka ndị mmadụ si kwuo n'elu Soshal midia.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: