You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nadal: echiela ya ọzọ tenịs nke iri na abụọ
Nwoke ama ama na-apịa egwuregwu lụn tennịs aha ya bu Rafael Nadal egosila ihe o ji bụrụ nwoke dịka o meriri nwoke si Austria aha ya bu Dominic Thiem n'asọmpi iko tenịs nke a akpọro Roland Garros.
Nadal ji akara 6-3,5-7,6-1,6-1, were merie Thiem.
Nadal meriri Federer ebe Thiem meriri Dkokovic nke mere ka ha abụọ zute onwe ha n'egwuruegwu nke ikpeazu iko Ronald Garros.
Gụọ ihe Nadal na ndị ọzọ n'ekwu maka mmeri a
Rafael Nadal : " Daalu @ronaldgarros maka mmeria, ọ ka dị m ka ọ bụ nrọ"
Tiger Woods : "Anaghi azọsa Nadal ọkwa Eze ụrọ na tenịs. Nadal ndewo maka mmeri nke 12"
Bolarinwa Olajide : Eze egwuruegwu tenịs nke ụrọ bụ Rafael Nadal abụrula ọnye mbu n'ụwa niile meriri iko Lụn Tenịs nke Ronald Garros ugboro 12.
Mmeri a mere ka Nadal bụrụ onye mbu n'ụwa niile gburugburu nke meriri asọmpi Roland Garros ugboro 12.