You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Federer abụrụla onye mbụ kacha kaa nka na tennis
Roger Federer ekwuola sị na ịbụ onye kacha kaa nka bụ onye mbụ n'ọkwa a na-agaghị echefu echefu n'egwuregwu tenis - afọ iri na anọ kemgbe o ruru n'ọkwa ahụ mbụ - bụ "atụmanya m bịara na mmezu".
Federer dị afọ iri atọ na isii, ji 4-6 6-1 6-1 merie Robin Haase n'ime agba nke asatọ n'ime asọmpi Rotterdam Open, nke mere o ji nọchie Rafael Nadal dị afọ iri atọ na otu, n'elu ọkwa.
Ọ gafekwara Serena Williams, onye dị afọ iri atọ na ise oge ọ dapụrụ n'ọkwa mbụ nke ụmụnwaanyị n'ọnwa May 2017.
Federer kwuru,"Nke a kacha bụrụ ihe nye m n'afọ iri atọ na isii, fọrọ ntakịrị ka o ruo iri atọ na asaa."
"Ị kawa nka, ị ga-etinyekwu uchu n'ọrụ karịa etu isi emebu mbụ. Ị ga-agba mgba ịnapụta ya onye rụsiri ọrụ ike irute ebe ahụ.
"Ịbụ onye mbụ bụ mmezu ebumnobi onye ọbụla na-apịa tenis. Ọ bụ ihe ịtụnanya inweta ya. Inweta ya ebe a bụ ebe m nọ nweta ohere m nke mbụ, kachasị bụrụ ihe nye m."
Federer bu ụzọ ruo onye mbụ n'ọkwa tenis n'ọnwa Febrụwarị 2004, mana ọ kwụsịrị ibụ mbụ n'ọkwa na Oktoba 2012 ma gbadaruo iri na asaa na Jenụwarị 2017.
N'agbanyeghị ya, o buliri iko asatọ gụnyere Wimbledon na Australian Open abụọ kemgbe ahụ.