Chelsea vs Watford: E gosila Watford na ọkwụrụ anaghị akarị onye kụrụ ya

Ndị ewgu bọolụ Chelsea

Ebe foto si, Getty Images

Chelsea ekweghi ka Watford menye ha ihere ma napụ ha ọkwa nke atọ ka ha zutere taa.

Ndị Chelsea chị ọkụ bịa ọkachasị n'ọkara nke abụọ oge e ji gbanye goolu atọ nyere ha mmeri.

Goolu Ruben Loftus-Cheek nyere na nkeji 48, nke David Luiz nyere na nkeji 51 na nke Gonzalo Higuain nyere na nkeji 75, zuru imechi akwụkwọ.

Mmeri a pụtara na Chelsea ga-enwe ohere ịzọ ma ha a ga-eso gbaa asọmpi Champions League nke afọ na-abịa.

Onye egwu bóólú Watford ebe ọ nọ n'ala.

Ebe foto si, AFP

Watford hiri ụra, nke nyere Chelsea ohere iji otu pọintị wụfere Tottenham, ma jiri ise na-aga Arsenal ga-ezute Brighton na mgbede taa bụ ụbọchị ise nke ọnwa Mee.

Ka ọ dị ugbua, Chelsea ga-ezute Leicester City ụbọchị ụka na-abịa, ma ha na Eintracht Frankfurt gbachaa n'asọmpi Europa n'ụbọchị Tọzde, Mee 9.