Europa League: Arsenal agwala Valencia na 'ogologo abụghị na nwa m etoola', Chelsea lara na nta

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Arsenal gosiri ndị Valencia na ọ bụghị egwuregwu ka ha bịara ịgwụ ka ha nabatara ha n'Emirates.

Goolu abụọ Alexandre Lacazette ji dọkachaa neetị ndị Valencia na nkeji 18 na 25, na nke Pierre-Emerrick Aubameyang gbanyere n'oge "gbaa ka anyị laa" na nkeji 90, zuru ịwụnye aja n'ime garị ndị Valencia.

Ebe o si ka njọ bụ na ndị Valencia bu ụzọ chọrọ okwu, ka Mouctar Diakhaby ji isi dọrie neetị Petr Cech na nkeji 11.

Mana Arsenal zuru ha ike n'ahụ, ma gwa ha na ị gaghị abịa n'ụlọ mmadụ kparịa ya.

Lacazette ji iwe mmeri atọ e merichara Arsenal n'ime asọmpi atọ ha gbara n'izu ole na ole gara aga, wee chọọ iti Valencia mmọnwụ ma mezuo goolu ya atọ, mana ochee goolu Neto ekweghi.

Arsenal ga-agakwuru Valencia n'azụ ụlọ ha n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Mee a, ebe ha ga-ama ma ha a ga-awụfere.

Ọ bụchaghị abalị ndị Chelsea

Goolu Luka Jovic nyerela ndị Eintracht Frankfurt na nkeji 23 kpalitere okwu n'asọmpi a, ma tinye ndị Chelsea na gbagharịwa.

Mana Pedro gbapụtara ndị Chelsea n'aka oke ifufe gaara efepụ ha, ka ọ gbanyere goolu na nkeji 45.

Ka a malitere, ajụjụ onye ọbụla bụ "gịnị kpatara Maurizio Sarri ji dewe Eden Hazard n'oche ezumiike"?

Mana Sarri mechara kwuo na o tinyeghi ya n'oge makana ọ chọrọ ka o zutu ike asọmpi ole ọ gbarala.

O mechara tibanye ya na nkeji 61, ka o wepụrụ Willian.

N'agbanyeghi na Chelsea emeghi etu ndị na-akwado ha si chọọ n'egwuregwu a, ha metere ihe ọma e ji kpụrụ ha n'ọnụ.

Na ha agbajughi goolu etu a chọrọ emeghi ka Chelsea ghara ịbụ otu a na-emeribeghi n'ime egwuregwu 16 ha gbarala n'asọmpi a.

Chelsea ga-ele ndị Eintracht Frankfurt ọbịa na Stamford Bridge ụbọchị itoolu nke ọnwa Mee a.

Is ha ọ ga-apụtakwa?