You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
World Cup 2018: Ịngland ejirila 2-1 merie Tunisia
Kane nyere goolu abụọ ka Ịngland meriri Tunisia 2-1 n'egwuregwu tọrọ ụtọ na-atụghị ụra maọlị.
Daalụ maka isonyere anyị taa. Sonyekwa anyị echi mgbe anyị ga-ewetara gị ihe ndị ọzọ na-agba.
E gbuchiela bọọlụ. Ndị Tunisia nwara ike ha, gbaa ezzigbo bọọlụ dịka ha kwesịrị, mana ndị Ịngland eburula ebube site na goolu abụọ ha nyere.
Nkeji 90: Ịngland ewepụla Lingard tinye Dier.
Nkeji 90: GOOOOLLLLUUUU! Kane enyela goolu. Nke a ga-eme ya goolu abụọ o nyerela n'egwuregwu a,
Nkeji 88: Loftus-Cheek eburula bọolụ bata n'ihu poostu Tunisia, mana ọ gbanyere Ben Mustapha bọọlụ n'aka.
Nkeji 87: Ndị Ịngland na-enye ndị Tunisia ezigbo nsogbu n'ihu poostu. Goolu ọzọ a ga-aga? Ka anyị na-ele anya.
Nkeji 84: Tunisia ewepụla Khazri, tinye Khalifa. Mgbanwe atọ ha kwesịrị ime ezuola oke.
Nkeji 82: Rashford enwetarala Ịngland 'corner'. Young gbara ya mana Ben Mustapha ji aka supu ya tupu o metụ n'isi Stones. Nsupu a o mere, emerụọla ya ahụ n'aka, mana agahị ewepụ ya.
Nkeji 79: Ewepụla nwaafọ Naịjirịa na-agbara Ịngland bụ Dele Alli, tinye Loftus-Cheek.
Nkeji 78: Young agbafuola 'free kick' ya. Bọọlụ gbafere n'elu poostu.
Nkeji 77: Ịngland enwetala 'free kick' n'ihu poostu Tunisia ka agbaturu Alli. Young ga-agba ya.
Nkeji 73: Tunisia ewepụla Sliti tinye Ben Amor.
Nkeji 71: Sliti agbaala shọọtụ n'ihu poostu Ịngland, mana ọ bataghị.
Nkeji 68: Trippier agbaala 'free kick' ha mana bọọlụ dapụrụ n'ezi.
Nkeji 67: Ịngland ewepụla Sterling tinye Rashford ka ha na-achọ ịgba 'free kick' n'ihu poostu Tunisia.
Nkeji 60: Ịngland agbaala 'corner' ha mana isi apụtaghị.
Nkeji 59: Trippier ebutela bọọlụ, mana shọọtụ ọ gbara pụrụ 'corner' ka onye Tunisia tinyere ya ahụ.
Nkeji 54: Ndị Tunisia na-acha ndị Ịngland ọkụ dị egwu.
Nkeji 51: Trippier agbaala 'corner' ha mana Ben Mustapha ghọrọla ya.
Nkeji 50: Ịngland enwetala 'corner' ka oche goolu ndị Tunisia ji ụkwụ gbapụ bọọlụ.
Nkeji 46: E bidola ọkara nke abụọ.
Nkeji 45 na ụma: Egbuchiela ọkara nke mbụ ka ndị mmadụ gaa ezumike nkeji 15. Otu abụọ a ka na-agba 1-1.
Nkeji 45: Ogbu bọọlụ etinyekwuola nkeji atọ maka oge e gburu ka Hassen nọ na-anata ọgwụgwọ.
Nkeji 44: Lingard abịakwala ọzọ n'ihu poostu, Ben Mustapha gbapụtara na poostu ya, mana ụkwụ poostu azọọla ha ka bọọlụ biri ya pụọ.
Nkeji 42: Lingard agbaala shọotụ n'ihu poostu, mana ọ banyeghị.
Nkeji 38: Bọọlụ erutela n'ihu poostu ndị Tunisia. Ọ banyeghị etu ndị Ịngland si chọọ. E ji VAR nyochaa ya mana isi apụtaghị.
Nkeji 35: GOOOOOOLLLLUUU! Ferjani Sassi enyela goolu. Nke a ga-eme ya goolu mbụ ndị si Afrịka ga-enye n'asọmpi a na-abụghị nke ha nyere onwe ha 'own goal'.
Nkeji 34: Ogbu bọọlụ enyela ndị Tunisia penariti. Sassi ga-agba ya.
Nkeji 33: Walker agbatuola Fakhreddine Ben Youssef. A na-enyo ihe nkiri VAR ịmata ma a ga-enye ndị Tunisia penariti. E nyere Walker akwụkwọ edo edo.
Nkeji 30: Maguire ataala isi gara nso neetị, mana Ben Mustapha ghọrọla ya.
Nkeji 23: Khazri agbaala shọotụ gafere elu poostu.
Nkeji 18: Walker bunyere Trippier bọọlụ, Tripper agbaa shọọtụ n'ihu poostu. Henderson butere bọọlụ a gbakwaa ya na neetị mana Ben Mustapha ghọrọla ya n'ala.
Nkeji 15: Ewepụla Hassen, tinye Ben Mustapha. Ọ pụtara na ada ọ dara merụrụ ya ahụ n'uvu ya.
Nkeji 11: GOOOOLLLLUUU! Kane agbakaala neetị site na 'corner kick' ha gbara.
Nkeji isii: Hassen bụ oche goolu ndị Tunisia adajiela onwe ya, mana enyela ya ọgwụgwọ.
Nkeji anọ: Maguire enwetala ohere iji isi taa bọọlụ, mana Hassen tinyere onwe ya mere ka ụkwụ Kane ghara inweta ya.
Nkeji atọ: Lingard nwetara ohere ịgbaka neetị ndị Tunisia, mana Hassen ekweghị ya. O ji ụkwụ gbafee ya poostu.
Otu Nkeji: Egwu ebirila ọkụ ugbua n'ọgbọ egwuregwu Volgograd.
Ndị nọ n'oche Tunisia: Farouk Ben Mustapha, Yohan Benalouane, Oussama Haddadi, Rami Bedoui, Saif-Eddine Khaoui, Mohamed Ben Amor, Ahmed Khalil, Aymen Mathlouthi, Bassem Srarfi, Saber Khalifa, Ghilane Chaalali, Hamdi Nagguez.
Ndị nọ n'oche Ịngland: Danny Rose, Eric Dier, Jamie Vardy, Jack Butland, Danny Welbeck, Gary Cahill, Phil Jones, Fabian Delph, Marcus Rashford, Ruben Loftus-Cheek, Trent Alexander-Arnold, Nick Pope.
Ndị Tunisiabidoro bọọlụ: Mouez Hassen; Dylan Bronn, Syam Ben Youssef, Yassine Meriah, Ali Maaloul; Fakhreddine Ben Youssef, Ellyes Skhiri, Ferjani Sassi, Anice Badri; Wahbi Khazri; Naim Sliti.
Ndị Ịngland bidoro bọọlụ: Jordan Pickford; Kyle Walker, John Stones, Harry Maguire; Jordan Henderson; Kieran Trippier, Jesse Lingard; Dele Alli, Ashley Young; Raheem Sterling, Harry Kane.
Ọtụtụ ndị mmadụ na-atụ anya na Ịngland ga-emeri Tunisia n'egwuregwu a. Kedụ ihe ị che?
Ndewo! Daalụ maka isonye anyị n'egwu a.