You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
World Cup 2018: Kroeshia agbatuola ugo Naịjirịa
'Super Eagles' Naịjirịa zutere Kroeshia n'asọmpị mbụ ha n'Iko Mbaụwa nke Rọshịa 2018.
Cheta na ọtụtụ mba ndị ọzọ, ma ndị tozuru ma ndị etozughị na-akwado otu Naịjirịa n'ihi na uwe ha masiri ndị ahụ.
Ha gbara n'ọgbọ egwuregwu nke Kalininigrad na mba Rọshịa.
Balogun merụrụ ahụ gbara ya ọbara n'imi na nkeji 23 nke agba nke mbụ ebe Rakitic ritere akwụkwọ edo na nkeji 30
Ka o ruru nkeji 32 ndị Kroeshia ritere otu ọkpụ n'aka Etebo mgbe bọọlụ ọgbahielu bara n'ime neeti Naịjirịa.
Kroeshia gbanwere ndị ọgba bọọlụ site n'iwepu Kramaric tinye Brozovic ebe Ighalo nwara ị ji isi tinye ọkpụ na neeti ha.
Iwobi pụrụ ezumike n'elekere 63 ka Musa banyere ị nọchị anya ya.
Super Eagles na-anwa na-agba a, ha kwalitere ị ji bọọlụ ha rue pesentị 47 site na 31 n'agba nke mbụ.
Troost-Ekong eritela akwụkwọ edo n'aka ogbu opi maka etu o si jichie onye ọgba bọọlụ Kroeshia bụ Mandzukic ebe ha na-azọ bọọlụ n'elu.
Nke a butere ndị Kroeshia penariti ha jie mezuo ọkpụ ha gbara Naịjirịa abụọ.
Mgbe nke a mere, ndị mmadụ gosiri foto a na-ekwu na ọ dị zị n'aka ndị ị zopụta Naịjịrịa
Na mgbakwunye oge, Rakitic na-akpa ike n'otu Kroeshia ritere ohere ị gba bọọlụ nke a kpọrọ 'Free kick' mana ọ mịtaghị goolu.
Kovacic nwara na nkeji 90+2 mana e gbochiri ya.
Ya mere na Kroeshia jiri ọkpụ abụọ merie Super Eagles ndị Naịjirịa.