You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
World Cup 2018: Lee ndị pụtara n'ala Rọshịa taa
Oge ahụ abịala oo. Anya niile na-ele anya n'isi obodo Rọshịa bụ Mọsko maka iko mba ụwa na-eme ugbua n'ebe ahụ.
Mba 32 sị mpaghara dị iche iche n'ụwa ga-asọ mpi ruru 64 tupu anyị amatra onye ga-ebu iko a n'ụbọchị 15 n'ọnwa Julai.
Puku kwuru puku mmadụ ndị egwuregwu bọọlụ na-amasị eruola Rọshịa ma na-egosikwa uwe dị iche iche maka inye otu dị iche iche otito.
Lee ụfọdụ ihe ndị mmadị na-eme n'ala ahụ
Asọmpị iko mba ụwa na-atọ ndị a dịka mmanya ọkụ.
Nwata nwaanyị a na-akwado ala ya bụ Rọshịa n'ụzọ pụrụ iche.
Ndị ihe ndị otu Saudi Arebia na-amasị sokwa na ndị na-akwado otu a n'ime ọgbọ egwuregwu Luzhniki na Mọsko.
Ngwa nụ oge 'Selfie' eruola!!
Ụmụ nwaanyị mara mma sokwa.