You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
World Cup 2018: Super Eagles ga-agafe agba nke mbụ - Ndị Naịjirịa
BBC Igbo gbara ụfọdụ ụmụnwaanyị maara akụkọ egwuregwu nkeọma ajụjụ banyere ogogo ha chere ndị Super Eagles ga-eru n'asọmpị ahụ.
Nwada Chisom Mbaọnụ onye ntaakụkọ egwuregwu kwuru na otu ha nọ n'ime ya siri ike mana ndị Super Eagles ga-agafe agba nke mbụ.
Onye ọzọ bụ Faith Oluchi kọwara na asọmpi Iko Mba Ụwa abụghị nke ụmụaka, kama nke eji ama ndị bụ nwoke.
Chidiebere Ezeani kwuru na NFF akwadola ndị Super Eagles Nkeọma maka asọmpi a, mana o kwenyeghi na ha tozuruoke ibu Iko a.
Ebe nwada Elizabeth Obong-Daniels kwuru na ihe kachasị mkpa bụ ka Super Eagles gbaa bọọlụ mara mma.