You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ibrahimovic eferela Man U aka
Nwafọ mba Sweden na-agbara Manchester United bọọlụ bụ Zlatan Ibrahimovic azọpụla njem iji gaa n'ihu n'akụm bọọlụ ya dịka ọ banyere otu LA Galaxy nke Amerịka.
Manchester United kwupụtara nke a ụbọchị Toosde, ụbọchị 22 nke ọnwa Maachị na ha nwere nkwekọrịta ka Ibrahimovic chabie ohere ọrụ ya n'atụfughị oge.
Ọ bụ ihe iju anya na nwaamadị a emepụtaghị oke ihe kamgbe o si ezumike mmerụ ahụ lọta n'ọnwa Nọvemba.
Ibrahimovic nwere ọkpụ goolu iri abụọ na itoolu n'ime egwuregwu iri ise na atọ n'oge ya na Manchester United.
"Ugbua bụ oge ị ga n'ihu mgbe afọ abụọ mara mma gacharala," bụ ihe o dere n'Instagram ya.
"Oke ihe sokwa abịa na ngwụcha. Ekele dịrị otu egwuregwu anyị, ndị egwuregwu anyị na-amasị, ndị otu m, onye nchịkọta anyị na mmadụ niile so keta oke n'oge m niile."
Otu egwuregwu ndị Ibrahimovic gbarala bọọlụ:
- Malmo FF afọ 1996 rue 2001
- Ajax afọ 2001 rue 2004
- Juventus afọ 2004 rue 2006
- Internazionale afọ 2006 rue 2009
- Barcelona afọ 2009 rue 2011
- Milan afọ 2011 rue 2012
- Paris Saint Germain afọ 2012 rue 2016
- Manchester United afọ 2016 rue 2018