Egwuregwu bọọlụ: Dịka o si gaa n'asọmpi nke taa

Ebe foto si, Getty Images
Enwere asọmpi n'etiti ọtụtụ egwuregwu bọọlụ dịna mba Yuropụ dị icheiche site na mba Ingụlandị, Sụpenị, Fụransị n'akwa Jamịnị.
Ọtụtụ otu egwuregwu bọọlụ gosiri ihe ha jiri bụrụ ọka ibe, ebe ndị ọzọ gbara ọnyụpa.
Lee dịka ọ jiri gaa n'ụfọdụ asọmpị ndị ahụ na nchịkọta;
Na mba Ingụlandị, otu Manchester United ji goolu abụo asatara otu merie ndị Liverpool, Everton gbara ndị Brighton ọkpụ goolu abụọ, onweghị onye nyere goolu n'etiti ndị Huddersfield na Swansea.

Ebe foto si, Getty Images
Newcastle meriri ndị Southampton site na-inye ha goolu atọ a na-asataghị otu, Leciester jiri ọkpụ anọ asatara otu merir ndị west Brom, Burnley jir goolu atọ merie ndị West Ham, ebe Chelsea jiri goolu abụọ asatara otu merie ndị Crystal Palace.
Na mba Sụpenị, Real Madrid nyere ndị Elbar goolu abụọ asatara otu, Valencia jiri goolu abụọ merie ndị Sevilla, Levante jiri otu ọkpụ merie ndị Getafe, dịka ọ na-aga n'ịhụ ugbua Barcelona na Malaga ka na-agba.

Ebe foto si, Getty Images
Na mba Fụransị, Paris Saint Germain jiri ọkpụ ise merie ndị Metz, ebe ndịọzọ ka na-aga n'ihu ugbu a.

Ebe foto si, Getty Images
A bịa na Jamịnị, Bayern Munich nyere Hamburgher ọkpụ isii, Ausburg meriri Hannover n'ọkpụ atọ asatara otu, Hertha Berlin na Freiburg emerighi ibe na nke ha.










