You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Arsene Wenger: Ọ ga-anọ ka ọ ga-ala?
Onyenchịkwa otu egwu bọọlụ Arsenal bụ Arsene Wenger ekwetela na ha agaghị enwe ohere ibu ndị nke anọ na 'Premiership' n'afọ a ka ndị Brighton, jiri ọkpụ goolu abụọ asatara otu merie ha n'ubọchị anọ n'ọnwa Maachị 2018.
Arsenal nọ n'ogo 6 dịka Tottenham Hotspur nọ n'ogo 4 ji akara iri na atọ aga ha.
Ha agaghị esi Champions League afọ n'abịa n'imi ma ọ bụrụ na ha erughi ogo nke anọ na tebulu "Premiership" afọ a.
Ha na AC Milan ga-ezute n'agba egwuruegwu 16 nke Uefa Europa League nke afọ a.
Ebe Arsenal nọ ugbua na-ewe ndị na-akwado ha iwe.
Na Naịjirịa, ndị a ma ama na-akwado Arsenal na ekwu ka a chụọ Arsene Wenger bụ onye nchịkwa ha.
Mmadụ dịka Rauf Aregbesola bụ gọvanọ nke Oshun steeti kwuru na Wenger kwesiri itinye akwụkwọ arụkwaghị m.
Banky W bụ onye oti egwu tinyekwara ọnụ n'okwu a. O kwuru na Wenger chọrọ ịnwụ n'ọrụ dịka onye nchịkwa Arsenal jiri ya maa atụ dịka onye chịburu Zibabwe bụ Mugabe.
Onye egwu Patoranking agwala BBC Igbo n'oge agbara ya ajụjụ ọnụ na naanị ihe mwute ya nwere na ndụ ya bụ oge ya na-etufu ikiri egwu bọọlụ ndị Arsenal ma emesịa ha gbawa ya obi.