You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Messi nyere Barcelona nhatanha ụnyaahụ
Ọkpụ goolu mbụ Lionel Messi nyere n'asọmpi Champions League itoolu ọ gbasoro Chelsea, nyerela Barcelona aka iwetara ha nhatanha na Stamford Bridge.
Chelsea gbochiri Messi ebe Willian nke Chealsea bịara nsọ inye gọọlụ ugboro abụọ na ọkara nke mbụ tupu ọ gba ọkpụ nyere ndị otu Conte ohere ị buru ụzọ n'elekere iri isii n'abụọ.
Otu Barcelona sị n'aka Iniesta nye ọkpụ abaghị tupu Messi ejiri ụkwụ ekpe ya nye ọkpụ goolu ahụ na nkeji ịrị asaa n'ise nyere ha na otu Chelsea nhatanha.
N'asọmpị Champions League ndị ọzọ, ndị amama Germany bụ Munich meriri Beskitas otu ndị Turkey ọkpụ ise asataghị ihe.