Messi nyere Barcelona nhatanha ụnyaahụ

Messi na onye otu ya Iniesta

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nke a bụ gọọlụ mbụ nke Messi n'asọmpị isii

Ọkpụ goolu mbụ Lionel Messi nyere n'asọmpi Champions League itoolu ọ gbasoro Chelsea, nyerela Barcelona aka iwetara ha nhatanha na Stamford Bridge.

Chelsea gbochiri Messi ebe Willian nke Chealsea bịara nsọ inye gọọlụ ugboro abụọ na ọkara nke mbụ tupu ọ gba ọkpụ nyere ndị otu Conte ohere ị buru ụzọ n'elekere iri isii n'abụọ.

Otu Barcelona sị n'aka Iniesta nye ọkpụ abaghị tupu Messi ejiri ụkwụ ekpe ya nye ọkpụ goolu ahụ na nkeji ịrị asaa n'ise nyere ha na otu Chelsea nhatanha.

N'asọmpị Champions League ndị ọzọ, ndị amama Germany bụ Munich meriri Beskitas otu ndị Turkey ọkpụ ise asataghị ihe.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ