Ndị Eze ọdịnala na ndị ụkọchukwu ekwuola ka a wụchie ndị na-akwado ịkpaoke agbụrụ

Igwe Afred Nnaemeka Achebe na Ụkọchukwu Valerian M. Okeke

Ebe foto si, Most Rev. Dr. Valerian M. Okeke/Alfred Achebe/Facebook

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Otu jịkọrọ ndị eze ọdịnala na ndị isi ụka n’alaigbo, adọọla aka na ntị nye ndị na-akatọ aha ndị Igbo na ndị na-akwado ịkpaoke agbụrụ.

Otu ahụ mere ka a mata nke a n’akwụkwọ ozi ha degeere gọọmenti etiti ka a wụchie ndị na-akpọ oku ahụ ma meputa iwu ga-akwụsị agwa dị etu ahụ n'ọdịnịrụ.

Ndị binyere aka n’akwụkwọ ozi ahụ gunyere Igwe Alfred Nnaemeka Achebe, Ụkọchukwu Chibuzo Okpoko, Igwe L.O.C Agubuzu, na ụkọchukwu Valerian Okeke.

Ha kwuru na ịkpaoke agbụrụ bụ ihe nwereike inweta ọgbaaghara, bute agha ma bụrụ nke nwere ike ikewaa obodo Naịjirịa.

Ozi ahụ gwara gọọmenti ka a wuchie ndị na-akwado ikpaoke agbụrụ megịde ndị Igbo na ndị ọzọ.

Ọ gara n'ihu kwuo ka ụlọomeiwu Naịjirịa mepụta ịwụ ga-amachị ikpaoke agbụrụ ma mee ka ntaramahụhụ dịaara ndị dara iwu ahụ.

Ọzọ bụ ka e nwee ihe nkuzi gbasara ọghọm dị na ịkpa oke agbụrụ ma kuziere ụmụ Naịjirịa ụrụ dị na ịbị na udo.

Ha dọrọ aka na nti nye ụlọọrụ mgbasa ozi ka ha ghara ikesa ọzị na-akwado ịkpaoke agbụrụ, ma gwa ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndịọzọ ka ha rụọ ọrụ wuchie ndị na-eme nke a.

Lee iwu Enyinnaya Abaribe gbadoro ụkwụ akpọ ka a nwụchie ndị na-achọ Igbo Must go

Omeiwu Enyinnaya Abaribe

Ebe foto si, NGR Senate

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ọgbakọ ndị omeiwu ọwụwa anyanwụ akpọọla oku ka ndị uweojii nwụchie onye nọ n'okpuru akara Lagospedia na-akpọ oku ka ndị Igbo si na Legọs pụọ.

Akara ahụ kpọrọ oku si ka ndị Yoruba niile jikọọ aka mee ngagharịiwe malite ụbọchị 20 n'ọnwa Ọgọst iji chụpụ ndị Igbo n'ala ha ma sị ndị Yoruba bi n'ala Igbo lọghachite.

N'ozi ha dere ha kwuru na akụkụ 41(1) nke iwu ala Naịjirịa nke 1999 dere sị "Nwa afọ Naịjirịa niile nwere ikike ịgagharị ebe ọbụla na Naịjirịa ma birikwa ebe ahụ, nakwa na o nweghi nwa afọ Naịjirịa ọbụla a ga-achụpụnwu na Naịjirịa maọbụ jụụ inye mbata", ka o kwuru.

Ihe ọzọ ha kpọpụtakwara bụ na n'akụkụ 15(4) kwuru na "Steeti ga-agba mbọ ịdebe ọnọdụ ndịnotu na njikọ n'etiti ndị dị icheiche iji hụ na nkwenye n'obodo ga-akarị nkwenye n'onwe".

N'ihu ihe ndị a niile bụ ihe anyị gbadoro ụkwụ na ya na-ekwu na oku #IgboMustGo megidere iwu ala Naịjirịa nke mere na ndị na-amalite oku ya ga-enweta ntaramahụhụ.

Ọzọ bụkwa na akụkụ 'section 42' na Bekee kwuru sị "apụghị imegide nwa amadi Naịjirịa ọbụla n'ụzọ ọbụla gụnyere iwu maọbụ atụmatụ, maọbụ ọrụ aka gọọmentị maka obodo o si, ụdịrị okike ya, okpupere ya, nkwenye ndọrọndọrọ ya maọbụ echiche ya"

Akụkụ iwu ahụ gara n'ihu kwuo na agaghị akwanyere onye ọbụla ugwu maọbụ nye ya emume dị iche ka nke enyere ndị ọzọ.

Ihe iwu a na-egosi bụ na mmadụ niile na Naịjirịa dị nhatanha n'anya iwu Naịjirịa.

Ndị omeiwu Ọwụwa Anyanwụ akpọọla oku ka a nwụchie ndị sị ka achụọ ndị Igbo na Legọs na ebe ndị ọzọ.

Sịnetọ Enyinnaya Abaribe na-anọchiteanya Abia South n'ụlọomeiwu Naịjirịa

Ebe foto si, Nigeria Senate

Ndị ụlọomeiwu si mpaghara Ọwụwa Anyanwụ edegara onyeisi ndị uweojii bụ Kayode Egbetokun akwụkwọ mkpesa ma kpọọ oku ka anwuchie ndị ahụ na-akpọ oku megide ndị Igbo na mpaghara Ndịda Anyanwụ Naịjirịa.

Akwụkwọ mkpesa bụ nke onyeisi ha bụ Sịnetọ Enyinnaya Abaribe na osote ya Igariwey Enwo zigaara ụlọọrụ onyeisi ndị uweojii akwụkwọ ahụ n’ụbọchị Tuzde 6 Ọgọst, 2024.

Ndị omeiwu rụtụrụ aka na mgbasaozi ahụ e mere na soshal midia X n’ụbọchị 27 Julaị nke gwara ndị Legọs na ndị ọzọ si na mpaghara ahụ ka ha chụpụ ndị Igbo n’obodo ha.

Atụmatụ a nke ha kpọro #IgboMustGo nke ga-amalite n’ụbọchị 20 Ọgọst ruo 30 Ọgọst, ka e kwuru bụ iji mee ka ndị Igbo si na mpaghara a pụọ n’ime otu ọnwa.

Mana ndị omeiwu a kwuru na kamgbe ozi ahụ pụtara na ọtụtụ ndị Yoruba ka na-akpọsi oku ike ka ndị Igbo kwakọro pụọ na-agbanyeghi na e mechie akara soshal midia wepụtara ya.

O nweela ihe ndị ọrụ nchekwa mere ?

Ndị okenye na ndị ọchịchị ala Igbo

Ọ bụ kemgbe izu ole ma ole ka otu akara dị na X bụbu Twitter kpọrọ oku ka achụlaa ndị Igbo niile bi na Legọs nakwa mpaghara ọdịda anyanwụ.

Akara ahụ bụ 'Lagospedia' kwuru ka e mee ngagharịiwe megide ndị Igbo ma nye ha naanị otu ọnwa ịkwakọ onwe ha na ụlọorụ ha pụọ na mpaghara ahụ niile.

Ugbua akara ahụ ka dị na Twitter n'okpuru aha ọzọ n'agbanyeghi na ndị mmadụ akpọọla oku ka X wetuo ya ya ebe ndị ọzọ gụnyere Gọvanọ Legọs steeti bụ Babajide Sanwo-Olu na Atiku Abubakar katọrọ ihe ọ na-ekwu.

Sanwo - Olu n'ozi o weputara kwuru ka ndị mmadụ gbachi oku ahụ nkịtị ma biiri onwe ha ma kwee nkwa ijigide udo na steeti ahụ.

Atiku Abubakar n'onwe ya weputara ozi n'akara soshal midia ya sị na oku ahụ na-enye nsogbu ma na-emegide atụmatụ udo na ibi n'udo e ji mara Naịjirịa.

Peter Obi bụ onye zọrọ ọkwa onyeisiala n'aha otu Labour Party sokwa kpọ oku ka enyocha, nwụchie ma taa ahụhụ ndị aka ha dị n'ịkpo oku mkpọmasị a.

Mana gịnị ka ndị ọrụ nchekwa na-eme gbasara ya bụ ihe?

Mgbe BBC kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs bụ Benjamin Hundeyin, ọ sịrị na ya ga-ekwu okwu mgbe oge ruru n'ihi na "ọ chọghị imebi mbọ niile ha gbarala" banyere okwu ahụ site n'ikwu okwu mgbe oge erubeghị.

Ndị na-agba tam tam e ji mara ndị Igbo
Nkọwa foto, Ndị Igbo bụ otu n'ime agbụrụ atọ kachasị na Naịjirịa.

Ihe iwu ala Naịjirịa kwuru maka mmegide onye site n'oke agbụrụ

Nwaanyị ikpe nkwụmọtọ

Iwu ala Naịjirịa pụtara 'Constitution' na Bekee nwere akụkụ ya ebe ọ machiri ikpaso mmadụ maọbụ otu ọbụla oke n'ụzọ ọjọọ kpam kpam.

Akụkụ ahụ bụ 'section 42' na Bekee kwuru sị "apụghị imegide nwa amadi Naịjirịa ọbụla n'ụzọ ọbụla gụnyere iwu maọbụ atụmatụ, maọbụ ọrụ aka gọọmentị maka obodo o si, ụdịrị okike ya, okpupere ya, nkwenye ndọrọndọrọ ya maọbụ echiche ya"

Akụkụ iwu ahụ gara n'ihu kwuo na agaghị akwanyere onye ọbụla ugwu maọbụ nye ya emume dị iche ka nke enyere ndị ọzọ.

Ihe iwu a na-egosi bụ na mmadụ niile na Naịjirịa dị nhatanha n'anya iwu Naịjirịa.

Kedụ ndị bụ ndị Igbo?

Mmemme mmọnwụ ndị Igbo
Nkọwa foto, Igbo nwere olu ndị kariri iri abụọ n'ime ha
  • Ndị Igbo bụ otu n'ime agbụrụ atọ kachasị na Naịjirịa.
  • Ndị Igbo bụ ndị bi na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.
  • Ha na-asụ asụsụ a kpọrọ "Igbo".
  • Ha dị steeti ise mejupụtara ala Igbo, ndị gụnyere: Abịa, Anambra, Ebonyi, Enugu na Imo.
  • E wezuga steeti ndị ahụ mejupụtara ala Igbo, e nwekwara steeti ndị ọzọ ụfọdụ mpaghara ya na-asụ Igbo dịka: Delta, Akwa Ibom, Rivas, Edo, Bayelsa, dgz.
  • Ndị Igbo gafere nde 30 pụtara ihe dịka pasentị 17 ọnụọgụgụ ndị niile nọ na Naịjirịa.