Ndị uweojii abụọ anwụọla dịka ha chụsasịrị ma gbuo ndị omekome n'Awka North

Ndị uweojii Anambra steeti

Ebe foto si, Anambra state police

Ndị uweojii Anambra steeti akụsasịala ebe atọ ndị omekome ji mere ebe nhibe isi ha n’okeọhịa Amukabia dị n’Achalla n’Okpuruọchịchị Awka Nọt.

Tochukwu Ikenga bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na ndị omekome ahụ wakporo ma gbuo ndị uweojii abụọ na otu onye nkịtị nọ na-achụ ndị omekome napụrụ mmadụ ụgbọala ya n'Oye-Agu Abagana, n’ụbọchị itoolu nke ọnwa Julaị afọ 2022.

O kwuru na ndị uweojii anọ ndị ọzọ so ha oge e mere ha ya bụ mwakpo lụsoro ha ọgụ ma jiri isi ha pụta dịka ha gbukwara ụfọdụ ndị omekome a.

Ikenga kwuru na ndị uweojii ahụ wakporo ebe ndị omekome ahụ jiri mere ebe obibi n'ime okeọhịa Amukabia n'ụbọchị 16 nke ọnwa Julaị 2022.

O kwuru na ndị uweojii chọtara otu okpokoro isi mmadụ, otu egbe RPG, ogbunigwe RPG abụọ otu egbe nkịtị, ụgbọala abụọ, ọtụtụ ọgwụ nakwa okpu ndị uweojii.

Ihe ndị uweojii Anambra chọtara

Ebe foto si, Anambra state police

Nkọwa foto, Ndị uweojii Anambra steeti chọtara ụgbọala abụọ n'ebe ndị omekome a na-ezo

O kwukwara na ha adọnyela ozu ndị uweojii na onye nkịtị ahụ ndị omekome a gburu n'ụlọozu.

Kọmishọna ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Echeng Echeng, ji ohere ahụ gwa ndị Anambra steeti na ha atụla ụjọ n'ihi na ha bụ ndị uweojii na-agba mbọ ịnapụta ma weghachite ala na ebe ndị omekome na-enye steeti ahụ nsogbu, si wee na-akpa mkpamkpa.