Etu nwa dị naanị otu afọ ji eze ya tagbuo agwọ kọbra

Nwaanyị na nwatakịrị

Ebe foto si, Aloka Kumar

Nkọwa foto, Govind Kumar dị otu afọ na-eme nke ọma ka ọ tagbuchara agwọ
    • Onye dere ya, Situ Tiwari
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Reporter
    • Ebeg o si, Bihar, India
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Nwatakịrị dị naanị otu afọ na mba India bụ Govind Kumar abụrụla okwu a kpụ n'ọnụ ka akụkọ pụtara na o ji eze ya tagbuo ajọ agwọ kọbra n'abalị iri na anọ nke ọnwa Julaị.

Govind Kumar na-egwu egwu na be nna ya dị na obodo a na-akpọ Mohchi Bankatwa dị na Bihar steeti dị nso n'oke ala Nepal mgbe ọ hụrụ agwọ.

Nwa nọ n'elu akwa.

Ebe foto si, Aloka Kumar

Nkọwa foto, Dọkịnta sị na mmadụ ịtagbu agwọ nwereike hara ịdị njọ ruo ka agwọ ịta mmadụ.

"Nne Govind Kumar na-arụ ọrụ n'obere ugbo ha dị nso" dịka nne ya ochee bụ Matisari Devi si kwuo.

Mana "Govind Kumar jidere agwọ ahụ jiri eze ya tagbuo ya".

Mana ka ọ nọchara nwa ntịntị oge, Govind were nsogbu kwụsịtụ imegharị ahụ nke mere e jiri buga ya ụlọọgwụ.

Mgbe e ruru ụlọọgwụ ka "a hụrụ na akụkụ ọnụ ya niile were apa ọnya" dịka Dọkịnta Kumar Saurabh bụ onye gwọrọ ya n'ụlọọgwụ Gọọmenti Kollege dị na isi obodo Bihar, Bettiah si kwuo.

Dọkịnta kwuru na otu ụbọchị ahụ ka ya gwọkwara nwatakịrị ọzọ agwọ kọbra takwara. Ụmụaka abụọ ahụ adịla mma ugbua.

BBC Igbo emepela WhatsApp Chanelụ
Nkọwa foto, Pịa aka ebe a ka i soro BBC News Igbo na Whatsapp

Dọkịnta kwuru na maọbụ mmadụ tara agwọ maọbụ agwọ tara mmadụ na ha abụọ dị njọ n'ahụike mmadụ mana o nwere nke ka ibe ya njọ.

"Mgbe agwọ tara mmadụ, ọ na-agbanye mmadụ nsi ya n'ọbara. Nke na-emetụta ahụike mmadụ ma mee ka ọtụtụ ndị ọ tara nwụọ".

"Mana mmadụ tagbuo akwọ, nsi ya na-aba n'afọ mana ime ahụ mmadụ na-emebi nsi ya nke mere o ji esi n'ahụ mmadụ apụ".

Mba India were udiri agwọ dị icheiche ruru 300 mana 60 n'ime ha nwere nsi na-egbu onye ọ tara. Agwọ kobra so na ndị nke nwere ajọ nsi na-egbu mmadụ.

Mba ahụ kacha enwee ọnụ ọgụgụ ndị agwọ tagburu n'ụwa niile kwa afọ nke na-akawanye njọ.

Ụlọọrụ ahụike mba ụwa bụ World Health Organisation (WHO) ekwuola na ihe dịka ọnụ ọgụgụ mmadụ 81,000 ruo mmadụ 138,000 bụ ndị agwọ tagburu n'ụwa niile kwa afọ..

Mana bido afọ 2000 ruo afọ 2019 ọnụ ọgụ mmadụ 58,000 ka agwọ na-atagbu na mba India n'afọ niile dịka WHO si kwuo.

Mịnịstrị na-ahụ maka ahụike na mba India kwuru na ndekọ ọnụ ọgụgụ ndị agwọ tagburu ka dị ala maka na ọtụtụ ndị nwụrụ maka ya nweghị ohere ịga ụlọọgwụ n'ime obodo ebe ihe ahụ kacha eme.