Fish Magnet: Etu e si tọọrọ ma gbuo Ifesinachi Onyekesi Martin oree azụ

Onyekesi Martins ka o bu azụ ya n'isi na-agbasa ozi ahịa.

Ebe foto si, Fish Magnet/Facebook

Nkọwa foto, Fish Magnet
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2
Akụkọ ndị a kachasị gụọ

Akwa na-arị ibe ya elu maka ogbugbu e gburu Ifesinachi Onyekesi Martin, nwokoroọbịa a ma ama na-ere azụ, nwee ụlọọrụ 'Fish Magnet' dị n'Awka, Anambra Steeti.

Akụkọ kwuru na ndị ntọrị wuchiri n'ụlọ nwamadị a bụ Ifesinachi dị n'Ezinifite, Okpuno, Awka n'ụbọchị 27 Julaị, gbaa ya egbe n'ụkwụ ma tọọrọ ya.

Na-erughi otu ụbọchị nke ahụ mere, ndị ntọrị ahụ kpọrọ ezinaụlọ ya n'ekwentị ma sị ha bịa buru ozu nwa ha nwụrụ anwụ.

Dịka ọnwụ nwamadị a pụtara ihe, soshal midia nwuuru ọkụ maka na ọ bụ onye a ma ama na-ere azụ ya n'akara soshal midia.

Ndị uweojii Anambra Steeti kwuru na ha na-esi imi n'ala iji chọpụta ma jide ndị ntọrị ahụ tọọrọ ma gbuo otu fish magnet'.

N'ozi ha wepụtara n'ụbọchị Wenezde, ọnụ na-ekwuru ha bụ Tochukwu Ikenga kwuru na enwetela ụgbọala nwamadị a ndị ahụ ji tọọrọ ya.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị na WhatsApp
Nkọwa foto, Pịa aka ebe a ka i soro BBC News Igbo na Whatsapp

Ikenga kwuru na nnyocha ha mere gosiri na ndị ntọrị a so nwamadị a n'azụ ruo n'ụlọ ya tupu ha awakpo ya, gbaa ma buru ya gbafuo.

O kwuru n'ebe a hụrụ ụgbọala ya bụ n'okporoụzọ Ukwulu/Igbariam dị steeti ahụ.

Ndị uweojii gaara n'ihu kwuo na ụgwọ ha ji ezinaụlọ ya na ndị Anambra bụ ịgba mbọ chọpụta ndị ntọrị ahụ ma taa ha ahụhụ ruuru ha.

Mgbe BBC Igbo kpọrọ ụlọọrụ nwamadị a bụ 'Fish Magnet' n'ekwentị, otu n'ime ha zara ekwentị kwuru na ọ bụ eziokwu na onyeisi anwụọla.

O nweghi ihe ọzọ o kwuru banyere nke a kama ọ sị ka anyị kpọtụrụ ezinaụlọ ya.

BBC Igbo ka na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ ezinaụlọ Onyekesi.