Ndị nọọsụ akagbuola abụbụọrụ ha gbara dịka gọọmenti kwenyere ime ụfọdụ ihe ha chọrọ

ndị ọrụ nọosụ n'ụlọọgwụ
Nkọwa foto, ndị ọrụ nọosụ n'ụlọọgwụ
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 7

Otu jikọtara ndị nọọsụ na Naịjirịa a kpọrọ 'National Association of Nigerian Nurses and Midwives (NANNM-FHI) akagbuole abụbụọrụ ha gbara dịka gọọmenti kwenyere ime ụfọdụ ihe ndị ha chọrọ.

Nke a na-abịa dịka ndị otu a nwechara nzukọ ndịisioche ha n'ụbọchị Satọde 2 Ọgọst, 2025.

Onyeisioche ha bụ Haruna Mamman gwara BBC na ihe mere ha jiri kagbuo abụbuọrụ a bụ na gọọmenti ekwela ime ụfọdụ ihe ndị ha chọrọ ma kwee nkwa na ha ga-aga n'ihu na mkparịtaụka n'ụbọchị Wenezde 6 Ọgọst, 2025 maka ndị nke fọrọ afọ.

Nkwupụta otu ndị nọọsụ n'Naịjiria wepụtara ịji kwụsị abụbụọrụ ha

Ebe foto si, Haruna Mamman/President National Association of Nigerian Nurses and Midwives

Nkọwa foto, Nkwupụta otu ndị nọọsụ n'Naịjiria wepụtara ịji kwụsị abụbụọrụ ha

Anyị ga-enwe nzukọ tupu anyị ekpebie banyere ịkwụsị abụbuọrụ – Otu ndị nọọsụ

Aha onyonyo, Anyị ga-enwe nzukọ tupu anyị ekpebie banyere ịkwụsị abụbuọrụ – Otu ndị nọọsụ

Otu jikọtara ndị nọọsụ na Naịjirịa a kpọrọ 'National Association of Nigerian Nurses and Midwives (NANNM-FHI) ekwuola na ha-enwebeghi mkpebi banyere ịkwụsị abụbụọrụ ụbọchị asaa ha gbara.

N'akwụkwọ otu a wepụtara dịka ha na Mịnịsta ahụike bụ Ali Pate nwechara nzukọ, osote odeakwụkwọ ha bụ Ofere Oluwatonyin si na ha agwala ndị otu ha niile na ha ga-enwe mkpebi ikpeazụ n'ụbọchị Satọde 2 Ọgọst, 2025.

Ha kwuru na ndịisi otu ha ga-atule ihe ndị gọọmenti kwuru na mkparịtaụka ha nwere.

Cheta na Mịnịsta Ali Pate kwuru na ndị otu a akagbuola abụbụọrụ ahụ mgbe ha nwechara nzukọ ahụ mana ndị otu e kwughi ihe ọbụla banyere nke a.

Ndị ọrụ ahụike

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị ọrụ ahụike
Akwụkwọ ndepụta otu ndị nọọsụ wepụtara maka nzuko ha na gọọment nwere

Ebe foto si, Ofere Oluwatonyin, Spokesperson NANNM-FHI

Nkọwa foto, Akwụkwọ ndepụta otu ndị nọọsụ wepụtara maka nzuko ha na gọọment nwere

Otu jịkọtara ndị nọọsụ akagbuola iwu nkwụsịtụ ọrụ ha nyere - Mịnịsta ahụike na Naịjirịa

Mịnịsta na-ahụ maka ahụike na Naịjiria

Ebe foto si, Ali Pate/X

Nkọwa foto, Mịnịsta na-ahụ maka ahụike na Naịjiria

Mịnịsta na-ahụ maka ahụike na Naịjiria bụ Ali Pate ekwuola na a kagbuole nkwụsịtụ ọrụ ndị nọọsụ na Naịjirịa bụ National Association of Nigerian Nurses and Midwives (NANNM-FHI) gbara.

Nke a na-abia dịka ndi ọtụ a na Mịnịsta ahụike nwechara mkparitaụka n'ụbọchị Fraịde 1, Ọgọst 2025 n'Abuja.

Dịka ọ dị ugbua, otu jikọtara ndị nọọsụ ekwubeghi etu nzukọ ha na mịnịsta a si gaa.

Cheta na ndị nọọsụ bidoro abụbụọrụ n'ụbọchị Tuzde 29 Julaị 2025 n'ihi ihe nkịtị gọọmenti etiti gbara na ịdọ aka na nti ubochi iri ise ha nyere.

N'agbanyeghị nkwupụta a mịnịsta na-ahu maka ahụike mere, iwu nkwụsịtụ ọrụ ndị otu nọọsụ nyere kwesịrị ị bịa na njedebe n'ụbọchị Tụezde 5 Ọgọst, 2025.

Gọọmenti ga-eme ihe gbara okpụrụkpụ ndị anyị chọrọ tupu anyị alaghachị ọrụ - Otu ndị nọọsụ

Otu onye nọọsụ na-agba onye ọrịa ọgwụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Otu onye nọọsụ na-agba onye ọrịa ọgwụ

Onyeisioche otu jikọrọ ndị nọọsụ na Naịjirịa a kpọrọ 'National Association of Nigerian Nurses and Midwives (NANNM-FHI)' bụ Morakinyo-Olajide Rilwan ekwuola na gọọment etiti ga-emezu ụfọdụ ihe ndị ha na-arụtụ aka ka e meere ha tupu ha alọghachi n'ọru.

Rilwan onye kwupụtara nke a n'ubọchi Tọsde 31 Julaị 2025 mgbe ọ na-azụ ajụjụ n'ụlọmgbasaozi Channels kọwara na-agbanyeghi nzụkọ ha na mịnịsta na-ahụ maka ọrụ na Naịjiria bụ Muhammadu Dingyadi nwere n'ụbọchị Tuzde, ndi nọọsụ ga-aga n'ihu na nkwụsịtị ọrụ ha na-eme ruo abali asaa ha nyere.

Ọ si na gọọment chọọ ihe ọbụla ha ga-eme iji hụụ na ndị nọọsu lọghachịrị n'ọrụ mana ha agaghị ekwe ma ọ bụrụ na-emezughị ihe ndị ha chọrọ.

Ndị nọọsụ ụlọọgwụ UNTH Enugwu, AE-FUTHA Abakaliki na steeti dị n'ọwụwa anyanwụ Naịjirịa esonyela n'abụbọọrụ

Ndị nọọsụ na-arụ n’ụlọogwụ University of Nigeria Teaching Hospital Ituku Ozalla Enugwu steeti ya na ndị nke Alex Ekwueme Federal University Teaching Hospital dị n’Abakaliki, esonyere nkwụsịtụ ọrụ a.
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ndị nọọsụ na-arụ n'ọtụtụ ụlọọgwụ gọọmenti etiti nwee na steeti ndị dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa esonyela na nkwụsịtụ ọrụ nke otu jikọrọ ndị nọọsụ na Naịjirịa na-eme ugbua.

Nnoycha ụlọmgbasaozi BBC mere gosiri na ndị nọọsụ na-arụ n'ụlọogwụ University of Nigeria Teaching Hospital Ituku Ozalla Enugwu steeti ya na ndị nke Alex Ekwueme Federal University Teaching Hospital dị n'Abakaliki, esonyere nkwụsịtụ ọrụ a.

Mgbe onye ntaakụkọ BBC rutere n'ebe ndị nwere ọria kansa n'anọ ụlọọgwụ UNTH, naanị ndị isi nọ n'ọkwa onye nduzi "Director" nọ n'ebe ahụ.

Anyị chọpụtakwara na ndị nọọsụ kwesịrị ịnọ n'ebe ndị gụnyere ngalaba a na-amụ nwa, ngalaba na-ahụ maka obi "Cardiology", ngalaba ebe e dobe mmadụ iche nakwa ICU anọghị ya.

Otu onye nọọsụ Angel Udegbunam kọwaara na ha ga-erube isi kpam kpam n'ihi na otela eji emegbu ha bụ ndị nọọsụ.

Ọ gara n'ihu kwuo na bụ ndị nọọsụ ka a na-ahapụrụ ọrụ niile n'ụlọọgwụ dị iche iche mana a naghị echeta ha n'ihe banyere ego.

N'aka nke ọzọ, ọnụ na-ekwuru ndị UNTH bụ Bonny Uchelue kwuru na a ga-enwe nzụkọ n'etiti ndị ịsị ụlọọgwụ ahụ na ndị ịsị otu nọọsụ tupu a mara ihe ọ ga ekwu.

Otu nwoke ya na nwa nọ nleta ahụike n'ụlọọgwụ ahụ bụ Maazị Reuben Okoh kwara arịrị na ka mgbe ụtụtụ ha ahụghị ndị nọọsụ na-eleta ha anya.

N'ụlọọgwụ AE-FUTHA dị n'Abakaliki, anyị hụrụ ọtụtụ ndị ọrịa ka ha nọ ọdụ ka ndị n'enweghị enyemaka n'ihi enweghị ndị nọọsụ nọ nso ilekọta ha.

Otu dọkịta bụ Aghor Udochukwu kwuru na nkwụsịtụ ọrụ ndị nọọsụ na-emetụta ndị ọrịa n'ezie ma kwuo na ọ bụ ndị dọkịta na-agba mbọ inyere ndị ọrịa aka.

Ọ kpọkuru gọọmenti ka ha gbaa mbọ ịhụ na ha mezuru ebumnobi ndị nọọsụ maka na ha dị oke mkpa n'ụlọọgwụ.

BBC News Igbo amalitela ịgbasa ozi n'ọbazi WhatsApp Channelụ
Nkọwa foto, Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Gịnị mere ndị nọọsụ jiri malite abụbụọrụ a?

Nkwụsịtụ ọrụ ndị nọọsụ a malitere dịka abalị iri na ise ha nyere gọọmenti etiti gafechara

Ebe foto si, Getty Images

Ọnọdụ ọrụ nlekọta ahụike na Naịjirịa nwereike inwe nnukwu nsogbu ugbua dịka ndị nọọsụ malitere nkwụsịtụ ọrụ nke abalị asaa na gburugburu Naịjirịa.

Nkwụsịtụ ọrụ a nke ndị nọọsụ kwuru na ọ bụ iji adọ aka na nti, malitere taa bụ Wenezde 30 Julaị 2025, dịka abalị iri na ise otu jikọrọ ndị nọọsụ na Naịjirịa nyere gọọmenti etiti iji dozie nsogbu niile na-emetụta ha, gachara.

Ka ọ dị ugbua, nkwụsịtụ ọrụ ndị nọọsụ a ga-emetụta naanị ụlọọgwụ na akụrụngwa gọọmentị etiti nwee na gburugburu Naịjirịa.

Ụlọmgbasa ozi nke mpaghara kwuru na otu jikọrọ ndị nọọsụ na Naịjirịa bụ National Association of Nigerian Nurses and Midwives (NANNM-FHI) kwuru na n'akwụkwọ ozi nke ha wepụtara, na nkwụsịtụ ọrụ a malitere n'elekere iri na abụọ nke abalị Tuzde, Julaị 29, ga-agụnye ịkwụsị ọrụ kpamkpam n'ofe ụlọọrụ ahụike gọọmentị etiti niile.

"Anyị a gwala ndị nọọsụ na mba niile ka ha mee ihe n'ụzọ zuru ezu ma kwụrụ n'otu," otu ahụ kwuru na nkwupụta ha na Mọnde.

Ndị mgbasa ozi mpaghara kwuru na Onyeisioche otu jikọtara ndị nọọru na Naịjiria bụ Morakinyo Rilwan kọwara na ụlọ ahụike ndị ọ ga-emetụta bụ ụlọọgwụ gọọmentị etiti iri asaa na anọ nke gụnyere ụlọọgwụ nkuzi, ụlọọgwụ gọọmentị etiti, ụlọọgwụ ndị ọkachamara, ụlọọrụ ahụike ndi nọ n'isi obodo niile nọ na Naịjiria.

O kwukwara n'ụlọọgwụ nke onwe esoghị ha maka na ndị nọọsụ.

Kedụ ihe mere ndị nọọsụ jị kwụsịtụ ọrụ?

Ndị nọọsụ kwuru na n'agbanyeghị na ha nyere gọọmenti etiti abalịị iri na ise iji mee ihe gbasara ọnọdụ ha, o nweghị ihe gọọmenti etiti maọbụ ndị nnochiteanya ha mere maka mkpesa ha.

Ebe foto si, Getty Images

Rilwan kwuru na ihe mere ha ji akwụsịtụ ọrụ ugbua bụ maka nkịtị gọọmenti gbara banyere nsogbu ndị ha na-enwe gụnyere ụgwọ ọnwa pere mpe, ụkọ ndị ọrụ, akwụghị ụgwọ ha ji egbo mkpa nke onwe, na ọnọdụ ọrụ adịghị mma, dịka ndị mgbasaozi mpaghara Naịjirịa siri kwuo.

Ọ gara n'ihu kwuo n'agbanyeghị na ha nyere gọọmenti etiti abalịị iri na ise iji mee ihe gbasara ọnọdụ ha, o nweghị ihe gọọmenti etiti maọbụ ndị nnochiteanya ha mere maka mkpesa ha.

Lee ihe ndị nọọsụ chọrọ n'aka gọọmenti etiti

Lee ụfọdụ ihe ndị nọọsụ Naịjirịa chọrọ n'aka gọọmenti etiti dịka ndị mgbasaozi mpaghara siri kwuo:

* Mmejuputa iwu nke National Industrial Arbitration Court (NIC) nyere n'ikpe na 27 Januwarị, 2012, nke gwara gọọmenti ka o bulie ego iji egbo mkpa nke onwe nke a na-enye ndị nọọsụ na ndị na-ahụ maka umunwannyi dị ime na ndị chọrọ ịmụ nwa.

* Ikewapụta ngalaba ihe gbasara ọrụ nọọsụ na mịnịstrị na-ahụ maka ahụike, ịtinye ndị nọọsụ n'isioche otu ndị ahụ maka ahụike ya na itinye ndị otu ha n'ụlọọrụ ahụike gọọmenti etiti.

* Ha chọrọ ka gọọment were ọtụtụ ndị nọọsụ ọhụrụ n'ọrụ dịka ọtụtụ ndị nọọsụ hapụrụ ọrụ ga gawa mba ofesi maka ọnọdụ ọrụ dị njọọ na Naịjirịa.

Gịnị ga-esochi nkwụsịtụ ọrụ abalị asaa a?

Onyeisioche otu jikọrọ ndị nọọsụ na Naịjirịa kwuru na ọ bụrụ na o nweghị ihe gọọmenti etiti mere n'ime abalị asaa a, ha ga-enyekwa ịdọ aka na nti ọzọ nke abalị iri abụọ na otu dịka iwu ndị ọrụ siri kwuo, tupu ha malite nkwụsịtụ ọrụ nke a maghị mgbe ha ga-alọghachite.