Kedụ ka e si a họpụta ndị imeobi Eze ọdịnala?

    • Onye dere ya, Michael Ngene
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

A bịa n'ala Igbo, ọ bụ Igwe obodo na-ahụ maka ọdịmma ndị obodo ya. Ọ bụ ya na-ekwuchitere obodo ya ma hụ na e nwere ezi mmepe nakwa udo.

Mana ọ bụghị naanị Igwe ka ọchịchị obodo dị ara.

Igwe ọbụla nwere ndị a kpọrọ ndị imeobi ya nke Bekee kpọrọ 'Cabinet'.

Ọ bụ ha na Igwe na-akpa nkata ma tuọ alo maka ọdịmma obodo.

Lee nkọwa etu e si ahọpụta ndị na-esonye n'imeobi igwe obodo n'ala Igbo:

Nhọpụta ndị imeobi Igwe n'ala Igbo

Ozo Ogaenyi Okwudili Agbo gwara BBC Igbo na ọ bụghị Igwe obodo na-ahọpụta ndị imeobi ya.

O kwuru na, "Ọ bụrụ na a họpụta Igwe n'obodo, ọ ga-edegara ụmụnna niile mejupụtara obodo ya akwụkwọ banyere ndị ha ga-ahọpụta ga-esonye n'imeobi ya. Ya bụ, ndị ụmụnna a ga-ahọpụta otu onye n'ime ụmụnna ha ka ọ gaa nọchite anya ha n'imeobi igwe".

A bịa n'ụmụnna ndị Igwe degara akwụkwọ ahụ, ha ga-enwe ọgbakọ ma tulee uche banyere onye ha ga-ahọpụta.

Ozo Ogaenyi Okwudili Agbo kwuru sị, "E nwere ọtụtụ ihe ndị ụmụnna ga-elebanye anya ya tupu a họpụta onye ga-anọchite anya ha n'imeobi igwe."

Ihe ndị a gụnyere, akparamagwa onye ahụ, ọrụ onye ahụ na-arụ, onye mara ihe ekwe na-akụ banyere ndị ụmụnna ya, ezinaụlọ ya, ụmụaka ya, ọgụgụisi ya nakwa etu o si ebi ndụ.

Ihe ọzọ a na-ele anya tupu ahọpụta onye ga-anọchiteanya ụmụnna n'imeobi Igwe bụ ịchọpụta ka onye ahụ enwere ntụkwasiobi. Nke bụ maka na ọ bụ naanị onye nwere ntụkwasịobi ga-enweta ezi nnọchiteanya nye ụmụnna ya n'imeobi Igwe.

Ọ bụrụ na ụmụnna tuleecha ihe ndị a, ha ga-edegara Igwe obodo akwụkwọ iji gwa ya na ha ahọpụtala onye ga-anọchite anya ha n'imeobi ya.

Gịnị bụ ọrụ ndị imeobi Igwe?

Ọrụ ndị imeobi Igwe jụrụ eju bara abara. Otu n’ime ọrụ bụ inweta udo n’obodo. Iji maa atụ, ọbụrụ na e nwere esemokwu dị n’etiti obodo na ibe ya, Igwe na ndị imeobi Igwe ya ga-anọ tụọ alo ma chepụta usoro ka mma iji kpezie okwu ahụ.

Ọzọ bụ na ọ bụ ndị imeobi Igwe na-ahụ na-enwere ezi mmekọrịta dị n’etiti obodo ha na gọọmenti ọchịchị. Ọ dụ ndị imeobi Igwe ịhụ na ụmụnna ha nwere ezi nnọchiteanya ma hụ na ha nwetara oke nke ha n’ihe ọbụla gọọmenti nyere ime obodo ha.

Ọ bụ naanị onye echichi na-esonye n'imeobi igwe?

Ozo Ogaenyi Okwudili Agbo gara n'ihu kwuo na ndị ụmụnna nwere ike ịhọpụta onye na-echighi echichi ka ọ nọchiteanya ha n'imeobi igwe.

"Ọ bụghị iwu na mmadụ ga-echi echichi tupu a họpụta ka ọ nọchiteanya ụmụnna ya n'imeobi Igwe."

Oge ụfọdụ ihe a na-elebanye anya bụ onye nwere obi umeala na onye e nwere ntụkwasịobi ebe ọ nọ. Ọ bụ onye dị etu a ka ụmụnna na-ahọpụta ka ọ nọchiteanya ha n'imeobi Igwe obodo.

Ka anyị jụrụ Ozo Ogaenyi ka ọ bụ naanị onye okenye kachasị n'ụmụnna ka a na-ahọpụta maka ịnọchiteanya ụmụnna ya n'imeobi Igwe obodo ha, o kwuru na ọbụghị onye kacha mee okenye n'ụmụnna ka a na-ahọpụta.

N'okwu ya "Ụmụnna nwereike ịhọpụta onye ọbụla ka ọ nọchiteanya ha n'imeobi Igwe obodo ha, ọbụghị iwu na ọ ga-abụ onye onye okenye kachasi n'ụmụnna ahụ, ihe dị mkpa bụ na onye ọ bụ onye nwere obi mmadụ, nwee ntụwkasịobi nakwa bụrụ onye aka ya kwụrụ ọtọ.

Ihe ọzọ anyị chọpụtara dịka Ozo Ogaenyi Okwudili Agbo si kọwaa bụ na ụmụnna ọbụla nwereike ịkpọghachita onye ha họpụtara ka ọ nọchiteanya n'imeobi Igwe.

N'okwu ya, "Ndị ime bụ ndị na anọchiteanya ụmụnna ha n'imeobi Igwe, mana ọ bụrụ na onye a họpụtara anaghị eme ọfụma, ụmụnna nwereike idegara Igwe akwụkwọ ka ha kpọghachita onye ahụ".

"Ọ bụrụ na nke a mee, ụmụnna ahụ ga-ahọpụta onye ọzọ ga-anọchi onye ahụ ha kpọghachitara", ka Ozo Agbo kwuru.

Gịnị ga-eme