Onyeisiala Tinubu ebinyela aka n'iwu ụtụisi ọhụrụ anọ

Ebe foto si, State House
- Onye dere ya, Michael Ilediagu
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 7
Onyeisiala Bola Tinubu nọrọ ụbọchị Tọzde 26, Juun, 2025 binye aka n'iwu ụtụisi anọ nke ụlọomeiwu kwadoro na nso nso a.
Mmemme ibinye aka ahụ nke mere n'obi ọchịchị Aso Rock, Abuja dọtara ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu na Naịjirịa gụnyere ndị ụlọomeiwu, ndị Gọvanọ, ndị minista nakwa ndị ndụmọọdụ onyeisiala.
Iwu ụtụisi anọ ahụ gụnyere Nigeria Tax Bill, Nigeria Tax Administrations Bill, Nigeria Revenue Service (Establishment) Bill na Joint Revenue Board (Establishment) Bill, nwetara nkwado ụlọomeiwu ka ha mechara nnyocha na ya.
Dịka ụlọọrụ Onyeisiala Tinubu si kwu, iwu ụtụisi ndị a ga-agbanwe ma hazie usoro e ji atụ ụtụisi na gọọmenti etiti, steeti nakwa okpuru ọchịchị na Naịjirịa ma wulite ego nweta, ọnọdụ azụmahịa nakwa mmekọ azụmahịa n'etiti Naịjirịa na mba ofesi ndị ọzọ.
Kedụ ka atụmatụ iwu ụtụisi Naịjirịa ọhụrụ ga-esi metụta gị?

Ebe foto si, Getty Images
Kemgbe Onyeisiala mba Naịjirịa Bọla Tinubu weputara iwu ọhụrụ dị icheiche ọ chọrọ ijiri hazie etu e si anata ụtụisi nakwa etu e si eke ego e nwetara na ya, ọtụtụ ndị mmadụ na-akatọ iwu ahụ ebe ndị ọzọ na-akwadọ ya.
Iwu a si n'aka Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu.
O nyere ndị omeiwu akwụkwọ iwu ụtụisi a bụ nke a gụrụ ugboro abụọ n'ụlọomeiwu ma na-akpata okwu.
Kemgbe Gọọmenti etiti wepụtara akwụkwọ iwu ọhụrụ a, ọtụtụ ndị Gọvanọ na-arịọ ka e nwe ndịdị ma nkwekọrịta tupu ya abụrụ iwu maka ihe ga-agbanwe.
N'ime Gọvanọ ndị ahụ gụnyere ndị si na mpaghara ugwu Naijiria. Ha na-akatọ ọtụtụ mgbanwe dị n'iwu ọhụrụ ahụ ma na-ekwu na ọ bụ steeti abụọ ga-akacha nweta ego ma ọ bụrụ na gọọmenti ekee ego e nwetara n'ụtụisi n'usoro ọhụrụ a.
N'akuko a, anyi ga-asa ajuju di icheiche otutu ndi mmadu na-aju okachasi ihe ndi ahu na-ese okwu nakwa ngaraba iwu ahu metutara etu esi eke ego e nwetere n'utuisi.
Cheta na e nwere ụtụisi dị icheiche mana nke anyị na-ekwu maka ya bụ ụtụisi a na-anara n'ụgwọ ọnwa na ụtụisi a na-akwụ na mbere ma ọ bụ ahịa a zụrụ.
Gịnị na-ese okwu?
Dika onyeisi ndi gọọmenti etiti nyere oru idepụta akwụkwọ iwu ụtụisi ọhụrụ ahụ bụ Taiwo Oyedele si kwuo "e nwere mgbanwe ruru nari abuo n'ime akwukwo iwu ụtụisi ohuru ahu".
Mana n’ime mgbanwe ahụ niile nke kachasị bụrụ okwu a kpụ n’ọnụ bụ etu e si eke ego a natara ndị na-azụahịa ma ọ bụ ndị na-arụpụta ihe a kpọrọ “Value Added Tax (VAT)” na bekee.
VAT bụ ụtụisi onye ọbụla nwere ihe ọ na-eme, ihe ọ na-arụpụta ma ọ bụ ihe na-enye ya ego na-akwụ gọọmenti.
Na VAT ka gọọmenti si enweta ego ha ji akwado idozi obodo bụ nke mere mgbanwe e tinyere n'etu e si eke ego e nwetere na ya jiri bụrụ okwu a kpụ n'ọnụ ugbua.
Mana enwepu VAT, e nwekwara ihe ndị ọzọ dị icheiche na-ese okwu n'iwu ụtụisi ọhụrụ ahụ.
Usoro e ji eke ụtụisi ugbua na mgbanwe a choro ime

Ebe foto si, Bayo Onanuga / x
Naịjirịa nwere uzo atọ e ji eke ego e nwetere n'ụtụisi ugbua bụ nke a chọrọ ịgbanwe na-ebute nghọtaghie.
Ndị ọchịchị ọ kachasị ndị Gọvanọ na mpaghara ugwu na-akatọ mgbanwe gọọmenti chọrọ ime na-ekwu ka e chere obere oge, nwe nkwekọrịta na ngalaba dị icheiche n'iwu ahụ tupuu eme ya ka ọ bụrụ iwu.
Usoro atọ ahụ gọọmenti ji eke ego ụtụisi gunyere ijiri ọnụ ogụgụ mmadụ bi na steeti nwere kee ego ụtụisi (population), iweputa ego ụtụisi a ga-eke nhatanha (Equity) nakwa nke ụtụisi dịka azụmahịa a zụrụ na steeti (derivation).
Lee uzo goomenti ji-eke ego ụtụisi ugbua na pasenti;
- Ụtụisi e nwetere n’ime steeti (derivation 20%)
- Nke a ga-eke nhatanha (equity 50%)
- Nke a ga-eke n’ọnụ ọgụgụ mmadụ na steeti (population 30%)

Lee usoro ọhụrụ goomenti chọrọ iji-eke ego utuisi;
- Ego a natara n’ime steeti (derivation 60%)
- Nke a ga-eke nhatanha (equity 20%)
- Nke a ga-eke n’ọnụ ọgụgụ mmadụ na steeti (Population 20%).

Usoro ndị a bụ etu gọọmenti si eke ego ụtụisi niile ha nwetere.
Nke a kpụtara na gọọmenti natachaa ụtụisi, ha ekerie ya ụzọ ụtọ atọ ndị a tupuu a mara ego gọọmenti etiti, steeti dị icheiche na nke okpuru ọchịchị ga-enweta.
Pasenti gọọmenti etiti, steeti na okpuruọchịchị na-enweta

Lee etu e si eke ya ugbua na pasenti ugbua:
- Gọọmenti etiti Pasenti iri na ise (15%)
- Steeti Pasenti iri ise (50%)
- Okpuru ọchịchị pasenti iri ịtọ na ise (35%)
Mgbanwe Gọọmenti chọrọ:
- Gọọmenti etiti Pasenti iri (10%)
- Steeti Pasenti iri na ise (55%)
- Okpuru ọchịchị Pasenti iri ịtọ na ise (35%).

Nkọwa kachasi mkpa na ndeko a bụ na gọọmenti etiti chọrọ:
- ka ego steeti na-eketa nhatanha dịrị obere.
- Ka ego steeti na-eketa maka ụtụisi ha natara n'ime steeti ha dịrị nnukwu karịa nke ahụ e kere nhatanha.
Ọtụtụ uru ụtụisi ọhụrụ ahụ bara ndị ọrụ
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Dịka Taiwo Oyedele bụ onyeisi ndị deputara iwu ụtụisi ohuru ahu si kwuo iwu ụtụisi ahụ nwepuru ego ụtụisi a na-anara n'elu ụgwọ ọnwa ọtụtụ ndị ọrụ.
Ọ kwuru na ndị ọrụ ruru pasenti iri itoolu na asatọ (98%) agaghị akwụ ụtụisi karịa.
Ndị na-eri ụgwọọnwa ruru otu nde naịra na narị puku asaa (N1.7m) ga-akwụ obere ụtụisi mana ndị na-eri ụgwọ ọnwa okpekatampe ma ọ bụ ndị ego ha jiri obere karịa ụgwọ ọnwa opekatampe agaghị akwụ ụtụisi.
Iwu ọhụrụ ahụ na-ekwu na tupuu mmadụ akwụọ ụtụisi na ụgwọọnwa ya ga-akarị naịra narị puku asatọ ma ọ bụ hara ịgafe optu nde naịra.
Adeyemi Adediran onye mara nke ọma maka ụtụsisi n'ụlọọrụ ụtụisi Arthur, Andersen dị na Naịjirịa kwuru na "mgbanwe gọọmenti chọrọ itinye ga-enyere ndị aka mee ka ụlọọrụ dị icheiche dị na mba ofesi agaghị akwụ ụtụisi maka na e nwere ndị Naịjirịa na-arụrụ ha ọrụ.
"Nke a ga enyere ụmụ Naịjirịa aka ịrị ụgwọọnwa mba ofesi ma hara ime ka ụlọọrụ ndị ha na-arụrụ ọrụ hara ịdaba n'aka gọọmenti maka ụtụisi.
Nkọwa VAT na mgbanwe ọhụrụ
Adeyemi Adediran kwuru na otu mgbanwe na-ese okwu bụ nghọtafe ndị mmadụ nwere etu esi eke ego ụtụisi ma etu e si ede ụtụisi a natara na steeti dị icheiche dịka Legọs.
"Ndekọ ụtụisi a niile sị na a natara ha na Legos adịghị ekwu nke bụ eziokwu gbasara etu ihe si kwụrụ maka na ọtụtụ n'ime ya bụ nke a natara na steeti ndị ọzọ".
"Ịma atụ, maka na otu ụlọakụ nwere isi ụlọọrụ ha na Legos, ha chọrọ itinye akwụkwọ ụtụisi ha, ha ga-etinye ya na Legọs mana ha zụrụ ahịa na steeti dị icheiche. Mana oge a ga-elele ụtụisi ha kwụrụ, ihe a ga-ahụ bụ Legos".
Mana mgbanwe ọhụrụ ahụ ga-enyere aka, ndekọ ụtụisi abụrụzịa naanị ụtụisi ụlọakụ ahụ kwụrụ na Legos ga-adị naanị n'aha Legos mana ụtụisi ha kwụrụ na steeti niile ha nwere ụlọahịa adịrị n'aha steeti".
"Isi okwu bụ na steeti niile ga-enweta ego ụtụisi gọọmenti natara n'ahịa ma ọ bụ mgbere niile a tụrụ na steeti ha dị icheiche".
Ihe ga-echere gọọmenti aka mgba
Adeyemi kwuru na otu ihe nwereike ịbụ nsogbu bụ etu akụrụngwa gọọmenti ga-eji nwete ndekọ gosiri ebe a tụrụ mgbere.
"Ihe gọọmentị bu n'obi bụ na ha ga-enweta akụrụ ngwa ha ga-eji mara ebe a nọ zụọ ahịa ma nweta ụtụisi mana nke a bụ nnukwu ihe ga-echere ha aka mgba".
"Ụlọọrụ igweokwu nwereike ha ahara iwe nsogbu na ndeko ha nwere n'ụtụisi ha na steeti n'ile mana ọ bụ ihe nwere usoro".









