Nkenye ndịda ọwụwa anyanwụ steeti ọhụrụ ga-abara onye ọbụla uru - Nnachi

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Charlse Gold Nnachi bụ onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara mmepe obodo ekwuola na nkwenye ụlọomeiwu Naịjirịa kwenyere a e kewepụta steeti ọhụrụ na ndịda ọwụwa anyanwụ ga-abara onye ọbụla uru.

Nnachi nyere azịza a maka ndị chọrọ ịma etu ọ ga-esi metụta ma onye ukwu ma onye nta n'ala Igbo.

N'okwu ya "ikenye ndịda ọwụwa anyanwụ steeti ọhụrụ ga-ebute mmepe ala Igbo karịa etu ọ dị ugbua".

"Ego gọọmenti etiti na-enye ndịda ọwụwa anyanwụ ga-agbagote ma mee ka ihe anyị na-enwete buo ibu".

Kedụ etu ọ ga-esi bara onye nkịtị uru?

Charlse Nnachi kọwara na steeti ọhụrụ ahụ ga-abịa ma bute mmepe gunyere ịrụ ụlọakwụkwọ, ụzọ, ụlọọgwụ na ihe dị ciheiche e ji enyere ndụ aka.

O kwuru na nke a ga-eme ka ndị Igbo niile nwee ike ịsị na gọọmentị anụla mkpu ha na-eti maka mkpagbu ha n'ọchịchị Naịjirịa.

Ọkaiwu Mike Ozekhome akatọọla atụmatụ ikepụta steeti 31 ọhụrụ

Onye ọkaiwu a maama bụ Mike Ozekhome akatọọla atụmatụ ikepụta steetị iri atọ na otu ọhụrụ nke ndị omeiwu Naijirịa chọrọ ka e kepụta ma kpọ ya imefu ego.

O kwuru na atụmatụ a "yiri ihe ejije" abụghị ihe mba Naijirịa kwesịrị itinye uche ugbu a, maka na Naijirịa nwere ọtụtụ ihe chere ya n'ihu o kwesiri itinye anya na ya.

Ozekhome jụrụ ihe kpatara ndị omeiwu ji akwado ikepụta steeti iri atọ na otu (31) ọzọ mgbe ihe karịrị ọkara abụọ n'ime atọ nke steeti ndị dị ugbu a enweghị ike ịkwụrụ onwe ha dịka ha na-atụkwasa obi na Gọọmentị etiti inye ha ego n'ọnwa n'ọnwa, dịka akwukwọ iwu Naịjirịa nke afọ 1999 si kwuo.

Onye ọkaiwu Ozekhome gara n'ihu kwupụta na mba Naijirịa chọrọ naanị ihe abụọ iji mezue ikpe na-ezighị ezi dị n'usoro ọchịchị Naijirịa ugbu a.

O kwuru na ihe abụọ ndị a gụnyere ikepụta otu steeti na ndịda ọwụwa anyanwụ nke ga-eme ka steeti dị na mpaghara ahụ hara ka ndị dị na mpaghara ndị ọzọ.

Ozekhome kwuru na Naijirịa chọrọ iwu ọhụrụ nke ziri ezi, nke ga-enyere aka mezie Naịjirịa.

Ihe ndị Igbo chọrọ na steetị ọhụrụ a na-ekewapụta - Omeiwu Chimobi Atu

Dịka ụlọomeiwu nke ndị nnọchịteanya n'Abuja nwere nkwekọrịta ma wepụta atụmatụ ikewapụta steeti ọhụrụ ruru iri atọ na otu na Naịjirịa.

Atụmatụ ahụ ọ bụrụ na ndị sịneti na gọọmentị etiti mee ka ọ bụrụ iwu ga-eme ka Naịjirịa nwee steeti iri isii na asatọ (63).

Mana otu onye omeiwu na anọchịte anya Enugwu North/South bụ Chimobi Atu kọwara ihe ndị Igbo chọrọ maka atụmatụ iwu ahụ ma kọwaa na isi sekpụ ntị abụghị ikepụta steetị ọhụrụ.

Ihe ndị South East na-achọ - Omeiwu Chimobi Atu

Omeiwu n'ụlọ nnọchịte anya bụ Chimobi Atụ kwuru na ihe ndị ndịda ọwụwa anyanwụ na-achọ bụ "ka e mee nwata ka e mere ibe ya".

N'okwu ya "ọ bụrụ na ị kwuo maka ịkepụta steeti ọhụrụ, ọzọ bụ gọọmenti Okpruọ chịchị ole ka a na-ekwu maka ya?"

"Ọ bụrụ na Naịjirịa na-eke ihe maọbụ ego, ihe e ji eke ya bụ steeti ole e nwere nakwa gọọmenti Okpuru ọchịchị ole dị n'ime ya".

Ịmaatụ, Enugwu nwere naanị mmadụ asatọ n'ụlọ omeiwu ndị nnọchịtaanya mana steeti dịka Kano, Kadụna na Legọs nwere ọnụọgụ ndị omeiwu karịrị iri abụọ. "Ị ga-akpọ ihe dị etu a na anyị nwere nhatanha n'ụlọ omeiwu? Ọsịsa ya bụ mba!.

E kwesịrị ikepụta steeti na gọọmenti Okpuru ọchịchị tinye n'ọdịda ọwụwa anyanwụ.

"Ọdịda ọwụwa anyanwụ nwere steeti ise, mana ndị ọzọ nwere isii maọbụ asaa. Nke a mere ndị ọdịda ọwụwa anyanwụ ji kwesi ịnweta steeti na gọọmenti Okpuru ọchịchị ka ha na ndị ọzọ dịrị nhatanha".

Etu e si chọọ ikewapụta steeti 31 ọhụrụ ndị ahụ

UGWU ETITI (NORTH-CENTRAL)

  • BENUE ALA steeti ga-esi na Benue Steeti pụta.
  • OKUN steeti ga-esi na Kogi Steeti pụta
  • OKURA steeti ga-esi na Kogi Steeti pụta
  • CONFLUENCE STATE ga-esi na Kogi Steeti
  • APA-AGBA STATE ga-esi na Benue Saụt Sịnatorial District pụta
  • APA STATE ga-esi na Benue Steeti pụta
  • Nakwa steeti nke ga-abụ Isi obodo a kpọrọ ABUJA

UGWU-ỌWỤWA ANYANWỤ (NORTH-EAST)

  • AMANA steeti ga-esi na Adamawa Steeti pụta.
  • KATAGUM Steeti ga-esi na Bauchi State.
  • SAVANNAH Steeti ga-esi na Borno Steeti.
  • MURI Steeti ga-esi na Taraba Steeti.

UGWU - ọdịda anyanwụ (NORTH-WEST)

  • NEW KADUNA Steeti ga-esi Kaduna steeti
  • GURARA Steeti ga-esi Kaduna Steeti.
  • TIGA Steeti ga-esi Kano Steeti.
  • KAINJI steeti ga-esi Kebbi Steeti.
  • GHARI Steeti ga-esi Kano Steeti.

NDỊDA -ỌWỤWA ANYANWỤ (SOUTH-EAST)

  • ETITI Steeti ga-esi na steeti niile dị na Saut East.
  • ADADA Steeti ga-esi Enugwu steeti.
  • URASHI steeti ga-esi saụt east.
  • ORLU steeti ga-esi saụt east.
  • ABA steeti ga-esi saụt east.

SOUTH-SOUTH

  • OGOJA ga-esi Cross River Steeti.
  • WARRI Steeti ga-esi Delta Steeti.
  • BORI Steeti ga-esi Rivers Steeti.
  • OBOLO Steeti ga-esi Rivers na Akwa Ibom Steeti.

NDỊDA ỌDỊDA ANYANWỤ (SOUTH-WEST)

  • TORU-EBE steeti ga-esi na Delta, Edo, na Ondo Steeti pụta.
  • IBADAN Steeti ga-esi Oyo Steeti.
  • LAGOON Steeti ga-esi Lagos Steeti.
  • IJEBU Steeti ga-esi Ogun Steeti.
  • OKE-OGUN ga-esi Ogun Steeti
  • IFE-IJESHA ga-esi Oyo, na Osun steeti pụta.