Onye hụrụ Simon Ekpa, Chika Edoziem, Bello Turji na ndị ọzọ kpọtụrụ anyị - Defence Headquarters

Isiụlọọrọ ngalaba nchekwa na Naịjirịa a kpọrọ “Defence Headquarters” akpọpụtala aha Simon Ekpa, Chika Edoziem na mmadụ iri itoolu na isii ndị ọzọ dịka ndị a na-achọ achọ.

Ebubo e boro mmadụ 97 ahụ bụ maka akparamagwa iyi ndụ egwu, igbu mmadụ, iguzobe otu iyi ndụ egwu nakwa iguzobe otu na-achọ ikewapụ na Naijiria.

Onye ji ọkwa mgbasaozi nke isiụlọọrụ nchekwa na Naịjirịa bụ Major General Edward Buba wepụtara ozi ahụ n'ụbọchị Fraịde ma kwuo na ndị niile aha ha na foto ha bipụtara n’akwụkwọ ozi ahụ bụ ndị ekperima a na-achọ achọ.

Simon Ekpa bụ onye a ma ama dịka onye na-elekọta otu alaka ngalaba Indigenous People of Biafra (Ipob) ọ kpọro 'autopilot' so n'otu n'ime ndị a kpọpụtara aha ha.

Ebe aha ndị ọzọ bụ ndị ndu otu dị iche iche na-eyi ndụ egwu dịka Boko Haram, Bandit dgz.

Ndị ahụ a na-achọ achọ si na mpaghara dị iche iche nke Ugwu Naịjirịa dịka North East, North West, North Central nakwa mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nke Naịjirịa

Ụfọdụ ndị ọzọ a na-achọ achọ

Northwest: mmadu 43 nke ndiisi ha gunyere; Alhaji Shingi; Malindi Yakubu; Boka ; Dogo Gide; Halilu Sububu; Ado Aliero ; Bello Turji; Dan Bokkolo; Labi Yadi ; Nagala; Saidu Idris; Kachalla Rugga na Sani Gurgu.

North East: mmadu 33 nke ndi isi ha gunyere ; Abu Zaida; Modu Sulum; Baba Data; Ahmad; Sani Teacher; Baa Sadiq; Abdul Saad; Kaka Abi; Mohammad Khalifa; Umar Tella; Abu Mutahid; Mallam Mohammad; Mallam Tahiru Baga; Uzaiya na Ali Ngule.

South East: 33 nke ndi isi ha gunyere ; Simon Ekpa; Chika Edoziem; Egede; Zuma, ThankGod Gentle; Flavour; Mathew; David Ndubuisi ; High Chief Williams Agbor; Ebuka Nwaka; Friday Ojimka.

Ndi ozo na south East bukwa Obiemesi Chukwudi aka Dan Chuk; David Ezekwem Chidiebube na Amobi Chinonso Okafor aka Temple.