You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Buhari tinyere ụfọdụ ego a napụtara ndị zupuru ya n'ịrụ 'Second Niger Bridge' - Fashola
- Onye dere ya, Uche Akolisa na Chukwunaeme Obiejesi
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalists
- Ebeg o si, Lagos
Minista na-ahụ maka ọrụ na ewumewu na Naijiria bụ Babatunde Fashola ekwuola ọchịchị Onyeisiala Muhammadu Buhari gbaliri na imezu nkwa o kwere ụmụ Naijiria n'okwu nchekwa, ibu agha megide nrụụrụaka nakwa ewumewu e ji akwalite akụnaụba.
Fashola kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nweere na nso nso a.
Ọ sirị, " N’okwu ọnọdụ nchekwa, Buhari agbalịala n’okwu nchekwa o kwudoro, kama ndị ọhụrụ dapụtara.
“Malite n'afọ 2010 rue 2015, Onyeisiala Naijiria enweghị ọgbakọ ọha ọbula n’ ogige 'Eagles Square ma n' Ụbọchị Ncheta Ndịagha, Ncheta Nnwereonwe Naijiria maọbụ ụbọchị ozi mbụ ya n’ọchịchị.”
"Ọ na-eme ya n’Ogige Aso Rock. Nke a bụ iji gwa gị ka ọnọdụ nchekwa dịbụ mana Buhari na-apụta ebe ahụ kwa afọ. Ọ pụtarịị n’abalị mbụ nke ọnwa Oktoba (afọ 2022)”. Ya bụ nsogbu a bụ nsogbu na-agbanwe agbanwe mana ị ga-ahụ ihe ndị ọma na-eme na nsonso a n’okwu nchekwa.” .
N'okwu ibu agha megide nrụrụaka, Fashola gbara ama na ọtụtụ ewumewu na-akwalite akụnaụba dịka akwammiri Naija nke Abụọ nakwa okporoụzọ a rụrụ n’Ọchịchị Buhari bụ ego ndị a natara ndị izupuru ego gọọmenti.
Fashola kwuru na “O nweghị onyeisiala ji ego e ji wuo ọtụtụ ihe n’ọchịchị Buhari bụ ego ndị.”
Ọ gara n’ihu isi kọwaa ihe mere na Gọọmenti ga-etinyenata usoro na-aga na-akwụ ụgwọ jibu agafee akwa mmiri Naija nke Abụọ.
Ọ kọwara uru ịrụ akwa Naijia wetara ndị Ọwụwa Anyanwụ, ndị bi na mpaghara ahụ nakwa ndị ọzọ ga-eji aga mkpa ha.
N’okwu ntụkọta Buhari tụkọtara mịnịstrị atọ; nke ọkụ, ọrụ nakwa ewumewu ọnụ ma mee ya onyeisi nke ndị mmadụ na-atụ uche na ọ ga-agbawa ya aka, Fashola kwuru na ọ bụghị naanị ya rụrụ ọrụ ahụ.
Ọ sịrị na na ọ bụ mkparị nye ndị odeakwụkwụọ Mịnịstrị ndị a nakwa (Permanent Secretary), ndị mịnịsta nta nakwa ndị ọzọ so ya rụọ ọrụ ndị nile a rụọla.
Kirie ihe o kwuru n’uju.
Uche Akolisa mere akụkọ, Chukwunaeme Ejesi sere onyonyo a, ebe Vining Ogu haziri ya.