Etu ọrịa 'brain tumour' si gaara ime ka m kpuo isi - Aproko Doctor

Nwa amadị a ma ama na Soshal Midia Naịjirịa bụ Chinonso Egemba, onye e ji Aproko Doctor mara akọọla etu o si gabiga ọrịa 'brain tumour' nke mere ka a waa ya ụbụrụ n'ime ọnwa Disemba afọ 2022.

Aproko Doctor kwupụtara nke a n'ihe onyonyo o tinyere n'akara soshal midia ya dị icheiche n'ụbọchị Mọnde.

O kwuru na nnyocha gosiri na o nwere ọnọdọ a na-akpọ 'Craniopharyngioma' nke mere ka ihe too ya n'ime ụbụrụ isi.

"Dịka onye ọrụ ya bụ inye nkọwa gbasara ahụike nakwa ihe mmadụ ga-eme ka iji nwee ezi ahụike, ọ gbara m gharịị mgbe nnyocha chọpụtara na m nwere ọnọdụ a," Dkt Egemba kwuru.

"Ana m eri nri dị mma, ọ kacha salad, anaghị m ese anwụrụ, anaghị m aṅụ oke mmanya..."

Mana ọ kọwara na ọnọdụ a bụ 'Craniopharyngioma' enwghị kpọmkwem ihe a ma na-akpata ya, onweghị kwanụ ụzọ doro anya mmadụ nwere ike iji zeere ya.

Ngosipụta ọrịa a, dịka Aproko Doctor si kọwaa, bụ na ọ malitere inwe oke isi ọwụwa nke ọ maghị ihe na-akpata ya. Ọ bụrụ na ọ ṅụọ ọgwụ, isi ọwụwa ahụ anaghị adajụ.

Nke sochiri isi ọwụwa bụ na ọ chọpụtara na anya aka ekpe ya anaghị ahụcha ụzọ nke ọma.

"Ụbọchị mbụ m chọpụtara nke a, agwara m nwunye m na ọ dịka o nwere ka anya si eme m, mana ọ sị 'Chineke ekwela'.

"N'otu mmemme ebe m kwesịrị ịbụ MC ka m chọpụtara na ọ dịka enwere urukpu kuchiri m n'anya, m wee pụọ n'iro ma mechie otu anya m, wee chọpụta na anya nke ọzọ anaghị ahụzị ụzọ," ka o kwuru.

Nke a mere ka ọ gaa ụlọọgwụ ma mee nnyocha pụrụ iche tupu e wee chọpụta na o nwere ọnọdụ 'Craniopharyngioma'.

Dkt Egemba gara n'ihu kwuo na ọ bụ n'ụlọọgwụ dị na Naịjirịa nakwa ndị dọkịta nọ na Naịjirịa wara ya ụbụrụ ma wepụ ihe ahụ toro n'ime ya.

Gịnị bụ 'Craniopharyngioma'

  • Ọ bụ ihe na-eto n'ime ụbụrụ mmadụ mana ọ bụghị kansa
  • Ebe ọ na-etokarị bụ na nso 'pituitary gland' na 'hypothalamus' - 'Pituitary gland' bụ akụkụ ụbụrụ na-emepụta 'hormone' dị icheiche n'ahụ mmadụ
  • Craniopharyngioma na-eji nwayọ eto, ọ naghị agbasa n'akụkụ ụbụrụ niile maọbụ n'akụkụ ahụ ọzọ
  • Ụzọ abụọ e nwereike isi wepụ Craniopharyngioma bụ ịwa mmadụ isi, maọbụ site n'ime onye ahụ wefee akụrụngwa aga eji wepụta ya
  • Onweghị ụzọ doro anya mmadụ ga-esi gbochie ya, onweghịkwanụ kpọmkwem ihe na-akpata ya
  • Ndịọrụ ahụike na-ekwu na pasentị 16 n'ime ndị nwerela Craniopharyngioma nwereike inwekwa ya ọzọ n'ime ihe dịka afọ atọ e ji wepụ nke mbụ