Ụlọikpe akagbuola nkpọghachị a kpọghachịrị Muhammadu Sanusi n'ọkwa Emir Kano

Ebe foto si, Kano State Govt./Facebook
Ụlọikpe Ukwu dị na Kano akagbuola ọchụchụ a chụpụrụ Aminu Ado Bayero na ndị ọzọ n’ọkwa dịka ndị Emir na Steeti Kano
Ụlọikpe mere mkpebi a n’ụbọchị Tọzde ma kagbuo usoro gọọmentị Kano Steeti jiri kposasịa iwu na-achịkwa ndị Emir a kpọrọ ‘Kano Emirates Council Law’.
Ọkaikpe Abdullahi Muhammad Liman nyere gọọmentị Kano steeti iwu ka ha gbaa jụụ n’okwu banyere nke a.
Ọkaikpe Liman kwuru na ndị ikpe a metụtara maara na o nwere iwu ụlọikpe nyere banyere nke a mana ha achọghị irubeisi na ya, kama ha gara n’ihu hiwe iwu ọzọ.
Ọkaikpe a kwuru na ụlọikpe ga-eji ikike o nwere mee ka ndị mmadụ rubeisi n’iwu.
Nke a pụtara na inyeghachị ọkwa Emir Kano nke e nyeghachịrị Muhammadu Sanusi adịghịzi ire ugbua maka na ụlọikpe atụgharịala iwu ahụ ma gwaa ha gbaa jụụ.
Iwu a ga-adị etu a ruo mgbe ụlọikpe mkpegharị ga-eleba anya n’okwu ahụ.
Kamgbe ọtụtụ afọ ezinaụlọ Sanusi na Bayero na-amakaarị aka ndị bụ ọkaibe n’oche ọchịchị Emir nke obodo Kano.
N’afọ isii gara aga ka Gọvanọ na-achị Kano n’oge ahụ bụ Abdullahi Ganduje chụpụrụ Muhammadu Sanusi n’ọkwa Emir nke Kano ma were Aminu Ado Bayero dochie ya, ma kesaa obi ọchịchị ahụ ụzọ ise.
Gọvanọ Kano Steeti enyela iwu ka a nwụchie Ado Bayero bụ Emir a chụrụ achụ

Ebe foto si, HRH AMINU ADO BAYERO/INSTAGRAM
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Esemokwu dị n’obi ocheze Kano ewerela ọnọdụ ọzọ dịka Alhaji Aminu Ado Bayero bụ onye Gọvanọ Abba Kabir wepuru n’ọkwa ọchịchị dịka Emir lọghachịrị n’obodo Kano n’ime abalị Fraịde.
Aminu Ado Bayero bụ onye ya ndị na-akwado ya batara n’ọdọụgbọelu Malam Aminu dị na Kano dịka ozi pụtara na ọ chọrọ ịbanye n’obi Emir na-agbanyeghi na e wepula ya.
Mana gọọmentị Kano Steeti natara ozi na nwamadị a batara Kano, nke mere gọvanọ Abba Kabir Yusuf na ndị ọrụ gọọmentị ndị ọzọ duuru Emir Muhammadu Sanusi gawa n’obi Emir nke Kano n’ihe dịka elekere otu nke abalị.
Akụkọ kwuru na gọvanọ ndị ọtụtụ ndị ọzọ ahụ nọ n’obi Emir ahụ chi abọọ.
Ugbua, gọvanọ Kano Steeti enyela iwu ka ndị ọrụ nchekwa nwuchie Alhaji Aminu Ado Bayero maka ịkpa agwa butere ọgbaghara na steeti ahụ.
Ozi si n’aka ọnụ na-ekwuru gọvanọ kwuru na dịka onyeisi nchekwa nke steeti, na gọvanọ enyela kọmoshọna ndị uweojii iwu ka ọ nwụchie Onyeze ahụ a chụrụ achụ na-egbughi oge maka ‘ime ihe ga-ebute ọgbaghara’ na steeti.
Cheta na ndị ụlọomeiwu Kano Steeti kagburu obi ọchịchị ise dị na Kano gụnyere Kanon, Bichi, Karaye, Gaya na Rano Abdullahi Ganduje bụbu gọvanọ hiwere.
N’otu ụbọchị Fraịde ahụ ka gọvanọ Abba Kabir Yusuf kpọghachịrị Muhammadu Sanusi II dịka Emir nke Kano ma nye ya akwụkwọ ikike, ebe ọ ga-anọ n’obi ọchịchị gọọmentị ruo mgbe ọ ga-alaghachị n’obi ọchịchị ya.
E dugharịala Sanusi n’iyi ọrụ dịka Emir nke Kano steeti

Ebe foto si, SANUSI LAMIDO/FACEBOOK
E duola Muhammed Sanusi II n’iyi ọrụ ọzọ dịka Emir nke Kano steeti.
N’oge ọ na-ekwu okwu na mmemme idu n’iyi ọrụ ahụ n’obi ọchịchị steeti ahụ dị na Kano, Gọvanọ Abba Kabir Yusuf sịrị na gọọmenti steeti ahụ agbasoola ụkpụrụ niile kwesịrị ekwesị iji kachapụ iwu hiwere alaeze a kpọrọ ‘monarchy law’.
N’okwu nke ya, Muhammadu Sanusi sịrị na ọ bụrụ na ahapụrụ nkesa alaeze dị iche iche na Kano, nkewa alaeze nwere ike ị dị na-aga n’ihu.
Dịka o siri kwuo, “ya bụrụ ma ahapụrụ nkewasị alaeze, otu ụbọchị e nwere ike họpụta Emir Fagge, Kunci maọbụ Kombotso.”
Ọnọdụ a na-abịa dịka ụlọikpe etiti nọọrọ ụnyahụ nye iwu ka akwụsị ikposa alaeze ndị ahụ n’oge Alhaji Aminu Baba Dan Agundi gbachara akwụkwọ n’ihu ya.

Ebe foto si, KANO STATE GOVERNMENT

Ebe foto si, KANO STATE GOVERNMENT

Ebe foto si, KANO STATE GOVERNMENT
E nyeghachila Sanusi ọkwa Emir nke Kano

Ebe foto si, Muhammadu Sanusi II/Twitter
Gọvanọ Kano steeti bụ Abba Kabir Yusuf eweghachitela Muhammadu Sanusi II dịka Emir nke Kano.
Gọvanọ ahụ kwuru nke a ka o binyechara aka n'iwu megharịrị iwu nke hibere iwu ọchịchị obodo Kano nke afọ 2019.
Ndị omeiwu Kano steeti nọrọ taa mee mkpebi maa kagbuo alaeze ise nke Kano - bụ Kano, Bichi, Rano, Karaye na Gaya.
E nyefere iwu ahụ n'aka gọvanọ onye mechara binye aka na ya.
N'okwu ya, Gọvanọ Kabir kwuru: "Mgbe a kagbuchara akwụkwọ iwu ọchịchị obodo Kano nke afọ 2019, nke a pụtara na alaeze nke Kano laghachiri n'ọnọdụ ya tupu iwu afọ 2019".
Ọ gara n’ihu kwuo na “Ọ bụ naanị Muhammadu Sanusi II bụ Eze enwere na Kano steeti".
Ndị omeiwu Kano steetị akwasaala alaeze ‘Emirates’ anọ nke steeti ahụ

Ebe foto si, KANO STATE GOVERNMENT
Ụlọomeiwu Kano steeti dị na mgbago Ugwu Naijiria nọrọ taa bụ Tozde 23 Mee 2024 kwado ka a kwasasịa alaeze ‘Emirates’ niile nke steeti ahụ maa kagbuo iwu ọhụrụ mepụtara alaeze emirate ọhụrụ n'afọ 2019.
Nke a pụtara n' iwu ochie nke ahụ hibere Emirate nke Kano adikwala ire ozo.
Mkpebi ọhụrụ a ụlọomeiwu ahụ mere gosiri na ndị eze(emir) ise nke Kano, Bichi, Karaye, Gaya, na Rano enweghizi oche ha.
Ọ bụrụ na Gọvanọ steetị ahụ bụ Abba Kabir binye aka n’iwu ọhụrụ a, ọ ga-enye ya ikike ịhọpụta Eze ọhụrụ n' alaeze ‘Emirate’ nke Kano.
Onyeisioche ụlọọgbakọ Mase Rinjaye na Kano bụ Lawan Hussaini kwuru na "Iwu ọhụrụ a ga-enye Gọvanọ Yusuf ike iji ị mara aha onye ndị na-ahụ maka ịhọpụta eze họpụtara."
"Ugbua, Kano steeti enweghị eze ọbula."

Ebe foto si, facebook/sanusi lamido
Cheta na n'afọ 2020 n'oge ọchịchị Umar Ganduje dịka Gọvanọ, Odeakwụkwụọ ụkwu steeti ahụ bụ Alhaji Usman Alhaji mara ọnwa nchutu n'ọkwa nke Muhammadu Sanusi dịka Emir nke Kano.
Gọọmentị steeti agara n'ihu wewapụta alaeze anọ ọhụrụ merere ya alaeze ise( 5 emirates) na Kano Steeti.
Lee ihe ị kwesiri ị maa maka Muhammadu Sanusi Lamido II

Ebe foto si, sanusi lamido/twitter
A mụrụ ya na ụbọchị 31 n’ọnwa Julai afọ 1961. Ọ bụ nwanwa Muhammadu Sanusi I. Ọ bụ onye a maara dịka ‘Khalifa Sanusi II’ bụrụkwa onyendu nke ‘Tijanniyah Sufi’ nke Naịjirịa.
Muhammadu Sanusi Lamido II bụ onye otu agbụrụ Dabo dynasty. O nwere oche dịka Emir 14 nke Kano n’ọnwa Jun 8 afọ 2014 ruo Maachị 9 afọ 2020.
Tupu ọ bụrụ Emir, Sanusi bụ onye nwere ọgụgụ isi nke Islam, onye ndọrọndọrọ ọchịchị na onye ọrụ ụlọakụ.
Ọ rụrụ ọrụ dị ka Gọvanọ nke ụlọakụ etiti Naịjirịa ‘Central Bank of Nigeria’ site n’afọ 2009 ruo afọ 2014.
O nwetara ezigbo mgbanwe n'ụlọakụ ruo mgbe a kwụsịrị ya ọrụ maka na-ogbarananwụ wuruwuru ego mmanụ ụgbọala ruru ijeri dọla 20.
A họputara ya na 8 Jun afọ 2014 ka ọ nọchie nnanna ya bụ Ado Bayero, dị ka Emir nke Kano.
Ka a họpụtarachara ya, ụfọdụ ndị tụrụ anya na ọ bụ nwa Bayero kwesiri ịnọchi nna ya dị ka Emir, ma kwugidere nhọpụta Sanusi ebe ụfọdụ kwenyere na ọ bụ maka ezi orụ ọ rụrụ n'oge ọ nọ na ụlọakụ etiti mere e jị họpụta ya dị ka Emir nke Kano.

Ebe foto si, sanusi lamido/twitter
N'ọnwa Maachị 9 afọ 2020, Sanusi nọ n'ụlọ obibi ya dị na Gidan Rumfa mgbe ọ nụrụ na Gọvanọ Abdullahi Ganduje achụpụla ya dị ka Emir nke Kano.
Ka ọ na-eche ka ndị ọrụ steeti nye ya akwụkwọ ozi nchụpụ ya, ndị uweojii, ndịagha na ndị ọrụ nchekwa wakporo n'obí ahụ.
Sanusi mechara nabata nchụpụ ya n'ocheeze nke ọ kowara dịka omume Chukwu ma gbaa ndị na-akwado ya ume ka ha nọrọ jụụ ma zere ịkwafu ọbara.
O kwuru na "Ọ bụ ihe obi aṅụri ịchị dịka Emir ma kwụsị n'ụdị nna nna ya bụ Muhammadu Sanusi I. onye chụpụrụ na afọ 1963."
Na 10 Mee afọ 2021, a họpụtara Sanusi ka ọ bụrụ onye ndu (khalifa) nke Tijaniyya Sufi na Naịjirịa.
Ọ bụ ọkwa dị mkpa nke nnanna ya nwere.









