Erosion: Nsogbu mbuze bịakwutere anyị akarịala anyị - Ndị Amamba Ụzụakọli
Ndị obodo Amamba Uzuakoli dị n'Okpuru Ọchịchị Bende dị n'Abia steeti ebekuola Gọọmentị Etiti na nke steeti ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka na nsogbu mbuze.
Onyeisi otu jịkọrọ ụmụafọ Amamba Uzuakoli bụ Chilasa Kanu gwara BBC Igbo na mbuze ahụ emebiela ọtụtụ ihe gụnyere ụlọ ise.

Kanu, onye gbara ama na obodo ha emefuola ijeri naira anọ(40m) n'igbo nsogbu mbuze nọ na nnukwu nsogbu dịka oke mmiri ozizo na ide mmiri merela ka nsogbu ahụ kawanye njọ.
N'otu aka ahụ, Okenye ọzọ bụ Chikezie Ogbonna tụrụ arịị sị na ndị obodo ha na-achị obi n'aka oge ọbụla mmiri na-ezo n'ihi egwu mbụze ma rụtụ aka na ụfọdụ agbaala ọsọ ndụ hapụ be ha.
Ụmụnwaanyị obodo ahụ tụrụ arịị na nsogbu mbuze ahụ na-ata ha ahụhụ ịga ugbo ma na-ebute egwu ma mmiri ozizo malite.
Kirie ya n'uju:






