Anambra Erosion: 'Mbuze na-abọpụtazị ozu eliri na Nnewi'
'100 Foot Road' bụ ụzọ dị n'Uruagu Nnewi mbuze na-anyụ anya kemgbe ọtụtụ afọ gara aga.
Ụlọ adabara n'ime ya, ruo ugbua ọ chabiri ụzọ 100 Foot abụọ.
Mazi Ugochukwu Ndefo, onye Uruagu Nnewi kọwara na ya bụ mbuze malitere ịkpa ike ihe dịka afọ iri atọ gara aga.
Ndefo kọwara na ka mgbe ya bụ nwatakịrị na ya bụ mbuze eriela ụlọ oriri na ọṅụṅụ Ekene dili Chukwu nwe, rie ụlọ akwụkwọ nakwa ụlọ na ngwa ahịa ndị mmadụ dị ọtụtụ.
Ọtụtụ ndị bị na ya bụ ebe kọwara na izu ụka abụọ gara aga na mbuze ahụ bọpụtara ozu otu nwoke eliri n' ala ya, nke mere na ndị nwe ya bịara buru ozu ya gaa lie ebe ọzọ.
Gee ndị bi n'ụzọ ntị n'ihe nkiri a.
Akụkọ a si n'aka Ebere Ekeopara

Akụkọ ga-amasị gị