Abia State Erosion: 'Mbuze na-achọ ikewa okporoụzọ anyị' - Ndị obodo Ekeoba, Umuahia

Aha onyonyo, Mbuze Ekeoba

Ndị obodo Ekeoba dị n'Umuahia, Abia Steeti ebekuola gọọmentị akwa arịrị maka mbuze na-enye ha nsogbu.

William Osuagwu, otu onye obodo ahụ, kọọrọ BBC Igbo na ọ fọrọ obere ka mbuze buru ụlọ ya.

O kwuru na ha na-agbapụ n'ụlọ ma mmiri zowe, n'ihi ụjọ na ụlọ ha nwere ike idakpu na mbuze.

Onye ọzọkwa bụ Nwakamma Aaron, kwukwara na mbuze ahụ na-achọ ikewa ụzọ jikọrọ ha na obodo mepere emepe.

Mana kọmishọna mgbasaozi Abia Steeti bụ Ọkaiwu Eze Chikamnayo kwuru na gọọmentị amalitela ileba anya na nsogbu ahụ.

Chikamnayo kwuru na Gọvanọ Abia State bụ Okezie Ikpeazu egosila na ọ dị njikere ịkwụsị mkpamkpa mbuze na-akpa na steeti ahụ.

O kwuru sị: "Gọọmentị Abia Steeti na ndị World Bank ejikọọla aka ibuso mbuze agha, n'atụmatụ a kpọrọ 'New Map'."

"Gọọmentị agaala leruo anya ebe ahụ ma bidokwanụ ọrụ."

"Ihe anyị na-ele anya bụ ka ya bụ ọrụ malite tupu udummiri eruo."

Ebee bụ Abia Steeti:

Map Abia Steeti

Ebe foto si, Abia State Government

Abia steeti bụ otu n'ime steeti ise mebere mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.

E kewapụtara ya dịka steeti n'afọ 1991. O nwekwara okpuru ọchịchị iri na asaa n'ime ya.

Ihe dịka mmadụ nde anọ bi na steeti Abịa, dịka ọnụọgụgụ dị n'ọba ozi gọọmentị steeti ahụ si depụta.

Etu mbuze si enye nsogbu na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa

Aha onyonyo, Mbuze na-enye nsogbu na steeti dị icheiche n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa

Mbuze bụ otu ọdachi na-enye nsogbu na mpaghara dị icheiche na Naịjirịa, ọ kachasị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.

Ọdachia a na-akwanye njọ ugbua n'ihi oke idei mmiri nke nsogbu mgbanwe ihu eluigwe na-akpata.

N'afọ 1981, gọọmentị wepụtara atụmatụ a kpọrọ 'Ecological Fund' iji buo agha megide ọdachi eke (natural disaster).

Atụmatụ a kwuru na a ga na-ewepụta pasentị abụọ n'ime ego niile na-abata n'akpa gọọmentị iji gbochie ọdachi ndị a.

N'ime afọ ndị gara aga, gọọmentị etiti Naịjirịa esila n'ime 'Ecological Fund' ksesaa ijeri kwuru ijeri Naịra nye steeti dị icheiche iji rụọ ọrụ maka ịkwụsị mbuze na ihe ndị ọzọ.

Mana odoghị anya kpọmkwem etu gọọmentị steeti si etinye ego ndị ahụ n'ọrụ.

Ọtụtụ ndị ntaakụkọ emeela nnyocha ma dee akụkọ gosiri na ụfọdụ ego ndị ahụ efuola n'ụzọ nrụrụaka.