NLC Strike: Ụlọakụ emepeghi n'ụfọdụ ebe dịka ha malitere abụbụọrụ ụbọchị abụọ.

Ndị bịara ịdọrọ ego kwụcha n'ezi

Otu jikọtara ndị ọrụ Bekee na Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress amalitela abụbụọrụ ụbọchị abụọ iji dọọ gọọmentị aka na nti banyere “ahụhụ ndị mmadụ na-ata.”

Nke a na-eso ozi onyeisiala bụ Joe Ajaero wepụtara n’ụbọchị 31 Ọgọọst ma sị na ha “ga-akpachi akụnaụba Naịjirịa ruo izuụka abụọ maọbụ atọ”

O kwuru na ha ga-eji abụbụọrụ ụbọchị abụọ nke ga-amalite n’ụbọchị ise na isii ọnwa Sepụtemba iji dọọ gọọmentị aka na ntị ma mee ka ha maara na abịaghị iti epele.

Ụlọakụ mechiri emechi

N’ụbọchị Mọnde ka gọọmentị etiti rịọrọ ndị ọrụ ka ha biko mịnye mma ha n’ọbọ ma gbaa jụụ n’ịgba abụbụọrụ ọrụ.

Minista na-ahụ maka ndị ọrụ bụ Simon Bako Lalong sị na gọọmentị mee ụfọdụ ihe ka ahụhụ ndị mmadụ na-ata n’ihi mbuli ọnụego mmanụ ụgbọala belata kama na ha chọrọ ka o zuo ọha ọnụ.

Mana ọ dịka ndị ọrụ Bekee gbara isi akwa gaa n’ihu n’ịgba abụbụọrụ ahụ taa bụ ụbọchị ise ọnwa Ọgọọst.

Ụlọakụ dị n'Abuja

Onye ntaakụkọ BBC Igbo kpagharịrị n’Abakaliki bụ isiobodo Ebonyi steeti chọpụtara na ọtụtụ ụlọakụ gbachiri agbachi n’ihi abụbụọrụ ahụ.

Ọtụtụ ndị chọrọ itinye maọbụ ịdọrọ ego n’ụlọakụ kwụcha n’ezi na-amaghi ihe ha ga-eme n’ihi nke a.

N'Abuja bụ isiobodo Naịjirịa, onye ntaakụkọ BBC chọpụtara na ụfọdụ ụlọakụ mepere ebe ụfọdụ emepeghi dịka ndị chọrọ ịdọrọ ego na-aga kwụrụ n'ATM.

N'otu aka ahụ, ụlọakụ ndị dị na mpaghara Ajah na Lekki nke Legọs mepechara emepe.

Ebe ndị mmadụ na-adọrọ ego n'ụlọakụ

Ihe mere NLC jiri agba abụbụọrụ

Otu jikọtara ndị ọrụ Bekee

Ebe foto si, NLC

Otu jikọtara ndị ọrụ a gara n’ihu kwuo na agwa ụfọdụ ndị gọvanọ na ndị ọrụ gọọmentị na-akpa so n’ihe ndị mere iwe ji ewe ha.

Ha boro ebubo na gọọmenti Abia steeti na-akpagbu ndị ọrụ Bekee.

“Gọọmenti Abia na-etinye n’aka na ndoro ndoro dịịrị otu ndị ọrụ ụgbọala NURTW na NULDE, na-achọ imanye ha ndị ndu n’ike.

Ha gakwara n’ihu kwuo na Nyesom Wike bụ minista FCT yiri egwu na ọ ga-akutusi ụlọọrụ ndị ọrụ Bekee bi n’Abuja.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post