Mortuary Attendant: “O nweghi anụ ahụ ozu mmadụ m na-ere ọ bụ ebubo ka e boro m”

Aha onyonyo, “O nweghi anụ ahụ ozu mmadụ m na-ere ọ bụ ebubo ka e boro m”

Otu nwoke nwe ụlọozu a gbara ọkụ n’obodo Ndiolumbe nke Isiala Ngwa South dị n’Abia Steeti ekwuola na o nweghi anụ ahụ ozu ọbụla ọ na-ere.

Nwoke sị na ọ bụ ebubo ka ndị anya ụfụ boro ya nke mere e ji bịa kutuo ụlọozu ya na Tọzde 4 Ọgọstụ, 2022.

N’okwu ya “Amalitere m ọrụ ichekwa ozu kamgbe afọ 2005, o nweghi akụkọ ọjọo ọbụla a nụrụ banyere ma rute ugbua”

“O nweghi onye ọbụla mụ na na-ese okwu, kama ọ bụ mmadụ abụọ ndị ụlọọrụ ha nọ m n’akụkụ na-ese okwu.”

Nwoke a gara n’ihu kwuo na mgbe ụfọdụ na oke nwereike ịta anụ ahụ ozu ha dosara n’ụlọozu, na ọ ga-abụ ya ndị bịara buru ozu hụrụ ma na-ebo ya ebubo.

Nwoke nwe ụlọozu a gbara ọkụ

Etu e si gbaa ụlọozu nwoke a ọkụ

Obodo ndiolumbe ebe a gbara ụlọozu ọkụ maka ebubo na ha na-ere anụ ime ahụ mmadụ
Nkọwa foto, Obodo ndiolumbe ebe a gbara ụlọozu ọkụ maka ebubo na ha na-ere anụ ime ahụ mmadụ

Akwụkwọ ozi dị icheiche na Naịjirịa ebugharịala akụkọ si na n'ụbọchị Wenzde ka ndị ntoroọbịa jiri iwe gbaa ụlọozu, dị na Ndiolumbe n'okpuruọchịchị Isiala Ngwa South n'Abia Steeti, ọkụ maka ebubo na a na-aghọta anụ ime ahụ ozu ndị edosara n'ime ya n’ụzọ na-ezịghị ezi.

Ụlọozu a gbara ọkụ
Nkọwa foto, Obodo ndiolumbe ebe a gbara ụlọozu ọkụ maka ebubo na ha na-ere anụ ime ahụ mmadụ

Gịnị ka ndị uweojii kwuru?

Mana BBC Igbo kpọkuru ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Abia steeti bụ Geoffrey Ogbonna, o wee si na enwebeghi onye denyerela ha akwụkwọ mkpesa maka ya bụ ihe ọdachi a. Ọ sị na ha na-eche onye nwe ya bụ ụlọozu a ka ọ bịa mee mkpesa o kwesịrị, mana ọ katọrọ ya bụ emume mmadụ iji aka ha ama mmadụ ikpe.

O kwukwara na nagbanyeghi ya, ndị uweojii eruola ebe ahụ ya bụ mkapkpa kpara ibido nlebanye anya n'ihe mere. Ọ sịkwa na mgbe ha ruru ebe ahụ, ihe ha hụrụ dị iche na n'akụkọ a kọrọ. Ọ sịkwa na ha ga-edenyere BBC Igbo ozi ha n'oge adịghị anya.

Ebe a gbara ya bụ ụlọozu ahụ ọkụ
Nkọwa foto, Ebe a gbara ya bụ ụlọozu ahụ ọkụ

N'ọnụ onye nwe ya bụ ụlọozu kwanụ?

Onye ntaakụkọ BBC hụrụ ụgbọala ya bụ onye nwe ya bụ ụlọozu e boro na ọ na-ere ya bụ anụ ime ahụ ozu ndị adọbanyere ebe ahụ na-agwaghị ndị nwe ha.
Nkọwa foto, Onye ntaakụkọ BBC hụrụ ụgbọala ya bụ onye nwe ya bụ ụlọozu e boro na ọ na-ere ya bụ anụ ime ahụ ozu ndị adọbanyere ebe ahụ na-agwaghị ndị nwe ha.

Onye ntaakụkọ BBC hụrụ ụgbọala ya bụ onye nwe ya bụ ụlọozu e boro na ọ na-ere ya bụ anụ ime ahụ ozu ndị adọbanyere ebe ahụ na-agwaghị ndị nwe ha.

Mana enwebeghị onye hụrụ maọbụ nụrụ ụkpọrọ ya bụ onye nwe ụlọozu a maka izara ọnụ ya.