Etu onye Keke siri weghachi N4m n'ahịa Arịarịa dị n'Aba

Ụfọdụ ndị na-agba Keke ibe ya, gụnyere Chika Nmeregini kwupụtara Obi ụtọ ha maka agwa ọma ahụ ọ kpara, ma kwuo na Chineke adịghị agọzi mmadụ site n'iru uju onye ọzọ.
Nkọwa foto, Lucky Okoro ji nde naịra anọ mmadụ chefuru n'ime Keke ya n'aka.
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ndị mmadụ etoola otu onye Keke n'Aba dị n'Abịa steeti maka agwa ọma ọ kpara nke bụ iweghachite ego karịrị nde Naịra anọ, nke otu nwaanyị o butere n'ụgbọala Keke ya chefuru n'ụtụtụ Tọzde.

Onye Keke ahụ, aha ya bụ Lucky Okoro, onye a maara nke ọma dịka 'Onye Photo', bụ nwaafọ obodo Umuomei kwụụrụ onwe ya dị n'okpuru ọchịchị Obingwa nke Abịa steeti.

N'oge ọ gwara onye ntaakụkọ BBC News Igbo okwu, ọ kọrọ na ya butere otu nwaanyị na-aga ahịa Arịarịa n'ọdọụgbọala dị n'Aba.

O kwuru na nwaanyị ahụ gwara ya na o si mba Kameruun bịa ịzụ ngwaahịa n'Aba nakwa na ihe a bụ nke mbụ ọ na-abịa Aba.

N'ihe dịka ọnwa anọ gara aga, otu onye Keke ọzọ aha ya bụ Emmanuel Obodoézè, weghachikwara nde Naira abụọ na narị puku anọ mmadụ chefuru na Keke ya.
Nkọwa foto, Maazị Lucky Okoro na-akwọ ụgbọ keke n'Aba weghachiri nde Naịra anọ mmadụ chefuru n'ime Keke ya.

Maazị Okoro kọrọ na ya rutere n'ahịa Arịarịa busa nwaanyị ahụ, gbara gawa mana oge o leziri anya n'ebe ndị njem na-anọ ya n'azụ, ọ hụrụ akpa. Ọ sịrị na mgbe ya mepere akpa ahụ, na ya hụrụ ụdị nnukwu ego ya akpatabeghi mbụ na ndụ ya.

O kwuru na ya maliteziri ịgbagharị gburugburu ahịa ahụ iji mara ma ya ga-ahụ onye na-achọ ego ya mana ọ ahụghị, gbakwunye na ya buzi akpa ego ahụ na Keke ya na-ebu ndị njem si Park aga Arịarịa na alọghachi ma na-elekwa anya ma ya ga-ahụ onye nwe ego ahụ.

Mana, mgbe ọ gafechara ihe dịka elekere iri nke ụtụtụ ka ọ bịaziri hụ otu nwaanyị na-ebe akwa, na-akụkwa onwe ya n'ala, na-ekwu na ya ga-egbu onwe ya.

Maazị Okoro sịrị na ya rịturu ma gakwuru nwaanyị ahụ, jụọ ya ihe bụ nsogbu, o kwuo na ya chefuru akpa ego ya n'ime Keke mgbe ya na-abịa ahịa.

Maazị Okoro sịrị na ya rịturu ma gakwuru nwaanyị ahụ, jụọ ya ihe bụ nsogbu, o kwuo na ya chefuru akpa ego ya n'ime Keke mgbe ya na-abịa ahịa.
Nkọwa foto, Maazị Okoro na-akwọ ụgbọ Keke ya na-acha ndụ ndụ.

Okoro kwuru na ya gwara nwaanyị ahụ na ọ bụ ya onwe ya bụ onye Keke ahụ, ma werezie ya bụ ego nyefee nwaanyị ahụ, na-agbanyeghị na e nwere ndị malitere ịkwa ya emo, nakwa ime ya akaja maka na ya bughachiri ego ahụ, mana o geghị ha ntị.

Ụfọdụ ndị otu ya na-agba Keke ibe, gụnyere Chika Mmeregini kwupụtara obiụtọ ha maka agwa ọma ahụ Maazị Okoro kpara, ma kwuo na Chineke adịghị agọzi mmadụ site n'iru uju onye ọzọ.

N'ihe dịka ọnwa anọ gara aga, otu onye Keke ọzọ aha ya bụ Emmanuel Obodoeze, weghachikwara nde Naịra abụọ na narị puku anọ mmadụ chefuru n'ime Keke ya.

Gọvanọ Alex Otti mechara nye nwoke ahụ onyinye, ma kwanyere ya ugwu pụrụiche maka ime ihe dị mma.