Ndị Nawfia akatọola ụzọ e siri gbuo ndị mmadụ n’okeala ha na Enugwu Ukwu

Ndị Nawfia akatọola ụzọ e siri gbuo ndị mmadụ n’okeala ha na Enugwu Ukwu

Ebe foto si, Screenshot

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ndị Nawfịa akatọọla ogbugbu e gburu ndị mmadụ n’ụbọchị Mọnde 9 Septemba 2024 n’okeala Enugwu Ukwu na Nawfia.

Otu Nawfia Progressive Union kwupụtara nke a n’ozi ha wepụtara n’ụbọchị Tọzde 12 Septemba 2024.

Ha kpọrọ ndị nchekwa oku ka ha mee ihe niile dị ha n’aka iji chọpụta ndị mere arụ ahụ ma nye ha ntaramaahụhụ kwesịrị ekwesị.

Ha kwuru na ndị otu ahụ na ndị ndu obodo ha na-akwado nnyocha ndị ọrụ nchekwa na-eme dịka ha na-eche ka anwụchie ndị ahụ mere ya bụ arụ.

Ndị otu ahụ kpọkwara mmadụ niile oku tụmadị ụmụafọ obodo mejupụtara Umunri ka ha wepụ aka n’ikwu okwu ọjọọ ndị na-akpali iwe na ọnụma kama ka onye ọbụla nwee ndidi chere ihe ga-apụta na nnyocha ndị ọrụ nchekwa na-eme.

Ndị isi Nawfia na Enugu-Ukwu ezutela Komishona ndị uweojii n'Anambra

Ihe ha na-akpa ga-aputa ihe na nsonso a

Ebe foto si, Anambra state Police Command

Ndị isi obodo abụọ bụ Nawfia nakwa Enugu-Ukwu bụ ebe nsogbu oke ala tara isi ụfọdụ mmadụ ezutela Komishona ndị uweojii n'Anambra steeti.

N'ozi Komịshọna ahụ bụ Nnaghe Obono Itam wepụtara ọ si na akụkọ ọhụrụ dị icheiche na-apụta na ya bụ okwu.

O nyekwara iwu ka e nyefee nyocha esemokwu ahụ n'aka osote ya na-elekọta ihe gbasara mpụ.

Cheta na esemokwu si n'ịzọ okeala malitere n'etiti Nawfia na Enugu Ukwu tara isi mmadụ atọ.

Etu o si me bu na ndị mere mwakpo a kpọro ndị ozo a n’ekwentị ma mee ka ndị chọrọ ịzụ ala n’ogbe ahụ.

Mana ozugbo ndị a rutere n’okeala ahụ, ndị ji mma na egbe wakpoo ha na mberede, gbuo mmadụ atọ ma merụọ mmadụ ise ahụ.

E gburu ndị a n'obodo Isionye bụ agbata Enugwu Ukwu na Nawfia

Ebe foto si, Wikipaedia

Ndị uweojii Anambra Steeti ekwuola na ha amalitela ime nyocha banyere ogbugbu e gburu ndị mmadụ n’Isionye dị n’okeala obodo Enugwu Ukwu na Nawfia n’ụbọchị Mọnde.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Tochukwu Ikenga kwuru nke a n’ozi o wepụtara ma kwuo na nyocha mbụ ha mere gosiri na e gburu mmadụ atọ ma merụọ ise ahụ.

O kwuru na ndị mere mwakpo a kpọro ndị a n’ekwentị ma mee ka ndị chọrọ ịzụ ala n’ogbe ahụ.

Mana ozugbo ndị a rutere n’okeala ahụ, ndị ji mma na egbe wakpoo ha na mberede, gbuo mmadụ atọ ma merụọ mmadụ ise ahụ.

Ikenga kwuru na ndị uweojii akpachiela ụgbọala ‘Sienna’ ndị ojiegbe a jiri mee mwakpoo ahụ, dịka ndị merụrụ ahụ na-anata ọgwụgwọ n’ụlọọgwụ ebe e bugala ozu ndị nwụrụ n’ụlọozu.

Dịka ọ dị ugbua ndị uweojii ekwughi ihe mere e jiri gbuo ndị a maọbụ okeala dịka ha ka na-eme nyocha.

“Obi agbawaala anyị maka ogbugbu ụmụnne anyị”

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Onyeisiobodo Enugwu Ukwu (President General) bụ Nze Patrick Nworji n’ozi o wepụtara na Mọnde kwuru na obi agbawaala ha maka ogbugbu e gburu ndị obodo ha si n’Isionye, nke a na-ache na ọ bụ ndị agbataobi ha mere.

O kwuru na Eze obodo ha bụ Igwe Ralph Ekpe katọrọ igbu ọchụ a ma rịọ ka ndị Enugwu Ukwu dere jụụ na aka ga-akpara ndị a.

O kelekwara gọvanọ Anambra Steeti maka izite osote ya bụ Onyekachuwu Ibezim ka ọ gaa leta ndị merụrụ ahụ n’ụlọọgwụ.

Mana mgbe BBC Igbo kpọtụụrụ Nworji o kwuru na ọ gaghị aza ajụjụ ọbụla ugbua banyere ihe a mere.

Odeakwụkwụ obodo Urukpele nke Isionye bụ Finba Ajiegbu gwakwara BBC na obi adịghị ha ma maka ihe a mere, o kwuru na otu n'ime ndị a e gburu bụ onye ụmụnna ya.

"Obi na-akụ anyị ilu maka ihe a mere, ọtụtụ nyocha anyị mere ekpuheela ndị a na-eche na aka ha dị na ya.

"E nwere ọtụtụ ihe akaebe gosiri na a ga-anwụchinwu ndị a n'ebe ọbụla ha nọ, ya mere anyị na-akpọkụ gọọmentị na ndị ọrụ nchekwa ha ka ha rụọ ọrụ ha ọfụma.

"Anyị agaghị eji aka anyị megwara ihe e mere anyị maka na ọ dịghị n'omume anyị, mana n'ime ihe niile obi adịghị anyị mma."

Ajiegbu kwuru na ihe a mere n'agbata oge elekere 11 nke ụtụtụ na elekere atọ nke ehihie.

N'otu aka ahụ, onyeisioche obodo Urukpele bụ Mathias Okechukwu kwuru na enyela ndị ntoroọbịa ha na-eme ngagharịiwe iwu ka ha dere jụụ ka e soro ụzọ iwu nwụchie ndị aka ha dị n'arụ a.

"Otu n'ime ndị a e gburu bụ Ifeanyi Nkwocha na-akwado iso zọọ ọkwa Kaụselọ na ntuliaka okpuruọchịchị a ga-eme n'ọnwa Sepụtemba a mana ugbua ọ nwụọla.

"Nke a bụ nnukwu ihe mgbawa obi nye anyị, ọ bụrụ na mgbe gboo ka ihe a mere, ọ gaara abụ na agha adaala n'obodo."

Otu onye obodo Enugwu Ukwu na-achọghị ka a kpọọ aha ya ọ nọghị n’obodo ha mgbe ihe a mere kama na a kpọrọ ya n’ekwentị.

O kwuru na otu n’ime mmadụ atọ ndị a e gburu bụ nwanne ya nwoke si n’ezinaụlọ ha.