You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
'E ji ịwa m ahụ hazigharịa ihe m ji bụrụ nwaanyị ma mee ka m zuo oke'
- Onye dere ya, Bushra Mohamed
- Ndị mere akụkọ a, BBC News
- Ebeg o si, London
Ịdọaka na ntị: Akụkọ a nwere ụfọdụ ihe ndị eserese nwereike ịwụ akpata oyi n'ahụ.
"Enwere m oke ụjọ maka echiche ịwagharị ahụ ọzọ, na-agbanyeghị e kwenyere m. Mana m ga-eme ya maka ahụike uche m.”
Shamsa Sharaawe na-ekwu maka mkpebi ya ịwaghari ahụ ka e bepụrụ mkpụrụọtụ (clitoris) na ibe ya naabọ (vulva) ya afọ 25 gara aga, mgbe ọ dị naanị afọ isii.
Ọ bụ ndị ezinaụlọ ya na otu nwaanyị nọọsụ ọdịnala bere ya ugwu ahụ nke a kpọro "Female Genital Mutilation (FGM)" na mba Somalia.
E biela ihe karịrị ụmụagbọghọ na ụmụnwaanyị nde 250 ugwu n'ụwa niile, dịka akụkọ Unicef mere na nso nso a si kwuo.
N'Afrịka naanị, o kwuru na nke e meela ihe karịrị ụmụnwaanyị nde 140.
Na Somalia, Guinea na Djibouti, a na-ebi ọtụtụ ụmụagbọghọ ugwu (FGM) - ihe dịka pasenti 90%.
Ọ bụ nkwenye a na-ekwenyekaarị na mba ndị a na ibi nwaanyị ugwu na-eme na nwagbọghọ ghara ịma nwoke maọbụ nwaanyị - àgwà a na-akachasị gbapụta ihe na mpaghara ahụ.
A na-ahụta ụmụnwaanyị ndị na-ebighi ugwu (FGM) na Somalia dịka ndị na-achọ oke mmeko ha na nwoke nke ha kwenyere na o nwereike imebi aha ezinaụlọ ha.
Mgbe ọ na-eto, Shamsa kwuru na ya nwere oke ihe mgbu mgbe ọbụla ọ na-ahụ nsọ ya.
“Achoghịm ihe mgbu a ọzọ,” ka o kwuru.
N’afọ 2023, ọ gbara afọ afọ 30, Shamsa bidoro iche maka ịwagharị ahụ iji kwụsị ihe ahụ ụfụ a.
Ugbua, o bi na mba UK ma bụrụ onye na-ekwu ma na-ebu agha megide ibi ugwu (FGM).
“Enweghị ozi zuruoke banyere ibi ugwu (FGM). Ọ bụ ya mere m ji ekwu maka ya.
Ka o mechara nyocha, Shamsa chọpụtara na ọ bụ naanị na Germany ka a ga-awa ya ahụ.
O bidoro ịrịọ ego site n’ịntanetị ebe o nwetara puku dọla 31 ($31,000).
Ọtụtụ ndị nyere ya ego amaghị ihe ọbụla gbasara ibi nwaanyị ugwu (FGM), o kwuru na ya enwetazughị ego iji mee ịwa ahụ.
N’ikpeazụ, Shamsa kwụrụ puku dọla 37 ($37,000) iji leta nwa ya nwaanyị, ife ụgbọelu na ịme ịwaahụ ahụ.
"Nke a mere ka m jide ndị mmadụ ụgwọ. Ụgwọ m ji ụlọọgwụ ruru $4,045."
Usoro e jiri waa ahụ?
Ọ dị ụzọ ibi ugwu (FGM) anọ nwere ihe mmetụta dị iche iche. Nke mbụ bụ nke na-ewepụ mkpụrụ ọtụ. Nke abụọ bụ nke na-ewepụ ụfọdụ maọbụ mkpụrụ ọtụ na ime ọtụ.
Nke atọ bụ ịwa mmepe ọtụ nke ga-ahazigharị ime ọtụ. Nke anọ bụ nke kachasị nwe mmetụta, nke gunyere ibepu mkpụrụ ọtụ na ibe ya na ihe niile ya na ya so.
N’afọ iri gara aga, ndị dọkịta na-awa ahụ na-emepụta mmepụta iji gbochie mmebi na-esite n’ibe nwaanyị ugwu (FGM).
Dọkịta Adan Abdullahi, onye bụ dọkịta na-awa ahụ nọ na Nairobi, isi obodo Kenya, kwuru na e nwere uru ụmụnwaanyị na-erita site n’ibi ugwu (FGM).
“Ibi ugwu (FGM) na-enye aka n'ịmụ nwa, ọkachasị ndị mere ụdịrị nke atọ - nke na-eme ka e mechilatụ ọnụ ọtụ,” ka o kwuru.
Ọ gara n’ihu kọwaa na ihe ụfụụ dịka mmekọ nwoke na nwaanyị nwereike ibelata ma ọ bụrụ na nwaanyị bie ugwu (FGM).
'Ihe siri ike nye ahụ'
Haja Bilikisu, onye mba Germany si Sierra Leone e meela ọtụtụ ibiela ugwu (FGM) . Ọ na-agwa ndị ghanahụrụ ya ka ha mee nyocha iji chọpụta ihe niile gbasara ibi ugwu tupu ha e mee ya.
“Ịwa ahụ abụghị naanị iji dozie mkpụrụ ọtụ,” ka o kwuru.
“Ọtụtụ ụmụnwaanyị biri ugwu (FGM) nwere apa, nnukwu apa. Gị na dọkịta gị kwesiri ịkpa maka ya. Kedụ ka ị ga-esi wepụ apa ahụ? Kedụ ihe ị ga-eme ka ọtụ gị dị mma?
Ọ kọwara na ọ bụghị naanị maka mmekọ nwoke na nwaanyị mana ọ bụ maka ịmụ nwa.
Ibi ukwu ndị Haja mere, na-ewe ihe ruru awa isii iji mee.
Dọkịta Reham Awwad bụ onye so hiwe ụlọọgwụ dị n’Egypt a kpọrọ ‘Restore’ n’afọ 2020 iji nweta nleta nye ndị ghanarịrị ibi ugwu (FGM).
Dọkịta Awwad kwuru na ihe mere ya ji hiwe ụlọọgwụ ahụ bụ maka na ya hụrụ ihe mgbu ụmụnwaanyị e biri ugwu (FGM) na-agabiga mgbe ọ na-arụ ọrụ dịka dọkịta na-amụ ọrụ.
O kwuru na ọ bụ eziokwu na ibi ugwu (FGM) na-eweta nwereonwe, mana e nwere ihe dị omimi na ya.
“Echeghị m na ibi ukwu bụ ogbugbuo nsogbu nye onye ọbụla,” ka o kwuru.
Ahụ ọhụrụ
Maka ndị chọrọ ịwa ahụ, ihe mpụta ya na-adị mwute.
Haja kwuru na o nwere ya ọtụtụ oge iji nabatakwa ahụ ya ọzọ.
O kwuru na “Oge mbụ m hụrụ mkpụrụ ọtụ m, o chetara m ajụjụ m jụrụ onwe m, ọ bụ m nwe ihe a?”
“E biri m ugwu (FGM) mgbe m dị afọ asatọ. E leghị akụkụ ahụ m ahụ anya.”
Ugbua o na-enweta nleta, Shamsa kwuru na obi dị ya ụtọ na o biri ugwu (FGM).
“Mgbe m mgbakechara, e bidoro m ịmụ ka ndụ dị maka mkpụrụ ọtụ ọhụrụ m,” ka o kwuru.
“Mana ugbua, a ma m ihe ọ pụtara ị bụ nwaanyị zuru oke.”