Ihe Onyeisiala Muhammadu Buhari gara mee n'Imo steeti

Onyeisiala Muhammadu Buhari awụchịela n'Imo steeti dịka gọvanọ Hope Uzodinma nke steeti ahụ sonyere ya.
Ọtụtụ ndị ọrụ nchekwa sonyere ha dịka ọ wụbara ụgbọelu 'Chopper' ya pụrụiche.
Ha abụọ wụpụrụ ma wụba Ọrlụ ebe agbapere ọrụ ndị gọọmentị steeti ahụ rụrụ ebe ahụ.



Ebe foto si, Imo new Media/Facebook
Ọha ndị mmadụ gbakọtara n’akụkụ Imo steeti dị iche iche ebe ndị a tụrụ anya na Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-abịa mee meepe ọrụ ọhụrụ dị ịcheịche a rụrụ na steeti ahụ.
Ụzọ a nke ozi gọọmentị Imo kwuru ruru Kịlomịta 56 gafere so n'ime ihe Onyeisiala mepere nke gafere akụkụ okpuruọchịchị Owerri, Owerri Nọt, Ikeduru, Mbaitoli, Isiala Mbano, Onuimo na Okigwe.
Ihe ndị ọzọ ọ gbapere gụnyere okporoụzọ Owerri-Okigwe, nke Owerri-Orlu na ụlọomeiwu nke steeti ahụ a rụgharịrị arụgharị.



Osote onyeisi ndị uweojii Naịjirịa, Kọmịshọna ndị uweojii n’Imo steeti nakwa ndị isi ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ so na ndị nọ n’ama nke Amaraku ebe a na-eche nnabata onyeisiala Buhari.
Otu ụmụnwaanyị, ndị ntorobịa, ndị egwu nakwa ndị Eze ọdịnala dị ịcheịche apụtala ịnabata Onyeisiala Buhari agbanyeghị na ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) tiri iwu onye nọrọ n’ụlọ nke ha na-akpọ sit-at-home n’ihi taa bụ ụbọchị ikpe onyendu ha bụ Nnamdi Kanu n’Abụja.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Gọọmentị Imo zipụtara ozi n’ụbọchị Satọdee kwuo na iwu a agaghị emetụta ọbịbịa onyeisiala Buhari.
Kọmịshọna mgbasaozi steeti ahụ bụ Declean Emelumba kwuru “E nweghị onye nwereike imaja Onyeisiala Buhari, onye bụ onyeisi ndị agha Naịjirịa. Imo steeti so na steeti ọ na-achị nke nyere ikike ịbịa ebe ahụ etu o siri chọọ. Ndị ọrụ nchekwa kwụ chịm n’ọrụ ha ịhụ na ọbịbịa ya gara nke ọma”.
Mgbe onyeisiala Muhammadu Buhari mepeechara ọrụ ndị a, ọ gara n’Owerri ebe e mere mmeme ịnabata ya nke ọma. O toro ọrụ ọchịchị ya na-arụ nakwa ọrụ Hope Uzodinma na-arụ n’Imo steeti.
N’okwu ya, ọ sị:
“Ndị kwesịrị ikwu okwu ọrụ ọma anyị na-arụ anaghị ekwu ya. Ọchịchị m emeela nke ọma n’ọrụ.”
Gọvanọ Uzodimma kpọrọ onyeisiala ka ọ bịa hụ ma mepee ụfọdụ ọrụ ya bụ Uzodimma rụrụ ma onyeisiala rubekwara isi ma zaa ya oku ahụ. Nke a bụ nke ugboro abụọ onyeisiala na-aga Imo steeti kamgbe Uzodimma malitere ọchịchị dịka ha abụọ nọ n’otu pati bụ All Progessives Congress (APC).











