Ihiala ritual: Anyị amalitela nnyobanye n'ogbugbu mmadụ na Mbrakpa, Ihiala ebe ebu ozu abụọ na baro

Soshal midia mara jijiji n'ụbọchị asaa n'ọnwa June mgbe ihe onyonyo pụtara na Mbrakpa, Ihiala n'Anambra steeti ebe a sị na otu nwoke na otu nwaanyị gba ọtọ n'onyoonyo gburu ụmụokoroọbịa abụọ ka ha were gwọọ ọgwụ ego ka akụkọ si wee kwuo.

Kedụ ka akụkọ gbasra ịgbu mmadụ abụọ maka ọgwụ ego si wee bido?

N'ihe onyoonyo na-efegharị si Mbrakpa n'Ihiala gosiri nwoke na nwaanyị a sị gburu mmadụ abụọ ma bee akụkụ ahụ ha dịka etu ha sị na dibịa si ha weta, mana a sị na ndị mmadụ nwudere ha ka ha na-akpa ike ọjọọ ahụ.

A sị na ndị obodo zukọrọ, gbaa ha ọtọ, bunye ha ozu ụmụokoroọbịa ahụ ha gburu na baro ma na-akpụgharị ha na obodo niile.

Mkpu akwa wee na-ada ebe niile, ma ụmụaka, ma ndị ntoroọbịa nakwa ndị agadị gbakọrọ na eti mkpu na udi ọdachi a n'ahịa Mbrakpa n'Ihiala.

Ihe onyonyo ahụ gosiri na ha etiela nke nwoke ihe tinka tiri pan.

Ka ọ dị ugbua anyị ezigarala ndị uweojii Anambra ozi ka ha gwa anyị ndị ha bụ nakwa ndị egburu egbu.

Ihe ndị uweojii kwuru bụ...

"Ihe a abụghị okwu ọgwụ ego, nke a bụ ogbugbu mmadụ kpọmkwem!" dịka ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Anambra steeti.

"N'elekere iri n'ụtụtụ n'ụbọchị asaa Juunu 2023 n'elekere iri n'ụtụtụ n'okporoụzọ Total dị n'Ihiala ka ndị uweojii zọrọ mmadụ abụọ n'aka ndị chọburu igbu ha site iti ha ihe nke ukwuu," ka Ikenga si kwuo.

Ozi mbụ ndị uweojii sị na ha nwetere gosipụtara na nwoke na nwaanyị a gbaraọtọ dịka a hụrụ n'onyoonyo ka igwe mmadụ duru ha bịa ụlọọrụ ndị uweojii boro ha ebubo ogbugbu ụmụokoroọbịa abụọ ebe ha sị n'ogbugbu a mere.

Ugbua, ma ndị e boro ebubo na ndị a sị nwụrụ ka na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ, ebe e bugara onye nke nwụrụla n'ụlọ ozu.

Kọmishọna ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Echeng Echeng na-ayọ ndị obodo ka ha nọrọ n'udọ, ka ha bụ ndị uweojii wee mee nnyobanye dị ire n'ihe mere nke ọma.

Ọ sị na Kọmịshọna Echeng ekwuola ka e buru ya bụ okwu gaa ụlọọrụ na-elebaanya n'ụdị mpụ a bụ State Criminal Investigation Department n'Ọka (n'Anambra).

Ikenga pịachịrị okwu na ọ ga na-agbasa ozi banyere okwu a ka oge n'aga.