Egbughị m nwunye m Osinachi, ọ bụ kansa ngụ gburu ya- Peter Nwachukwu

Peter Nwachukwu na Osinachi

Ebe foto si, Peter Nwachukwu/Facebook

Peter Nwachukwu, di Osinachukwu Nwachukwu,otiegwu ụka a ma ama agọọla na aka na ụkwụ ya adịghị n'ọnwụ nwunye ya ma sị na ọ bụ kansa ngụ gburu ya.

Peter kwuru nke a taa bụ Fraide n'ogige Ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị n'Abuja bụ ebe a kpụtara ya ịzara ọnụ ya n'ebubo na o tigburu nwunye ya.

gbe ndị uweojii kpụ ya na-aga n’ụlọ ikpe, ọ gwara ndị ntaakụkọ sị,

“Ataala m ahụhụ nke ukwuu maka ihe m na-emeghi,ndị mmadụ agbahapụla m.”

“ Ọ bụghị m gburu nwunye m, ihe gburu ya bụ ọrịa kansa nkụ(cancer of the lungs)”.

Nke a ka Peter nọ na-ekwu tupu a kpọba ya n’ime ụlọikpe ma mechie ụzọ.

Ụlọikpe etinyela Peter Nwachukwu na 'Kuje prison'

Osinachi na Peter Nwachukwu

Ebe foto si, Peter Nwachukwu

Ụlọikpe ukwu dị n’Abuja n’ụbọchị Fraịde nyere iwu ka a Peter bụ di Osinachi Nwachukwu ka nọrọ na nga ruo mgbe a ga-anụ banyere ikpe ya n’ebubo igbu nwunye ya.

Ọkaipke N.K Nwosu nyere iwu a dịka Peter nọrọ n’ụlọikpe gọọ na aka ya adịghị n’ebubo iri na atọ (23) e boro ya.

Ọkaikpe sị ka ọ ka nọrọ na nga ma yigharịa ikpe ya gawa n’ụbọchị iri na isii na isi na asaa nke ọnwa Juun.

“Ihe e mere taa bụ ịkpụpụta ya n’ụlọikpe, a ga-ebido izo ileba anya n’ike ngwa ngwa” bụ ihe ọkaikpe Nwosu-Iheme kwuru.

“Ka ọ nọrọgodi n’ụlọ nga ‘Kuje Correctional Facility’ ruo mgbe a ga-eleba anya n’ikpe ya”.

Onye bụ Peter Nwachukwu?
Osinachi na Peter Nwachukwu

Ebe foto si, Peter Nwachukwu/Facebook

  • Peter Nwachukwu bụ di Osinachi Nwachukwu, ọgụ egwu ama ama ụwa na-akwara arịrị ugbua maka etu o si nwụ nso nso a.
  • Nwachukwu bụ onye ụka na-aka ụka na Dunamis International Gospel Centre mabụrụkwa onye na-agbasa oziọma n'ụlọụka ahụ.
  • Ọ bụ onye Ụboma dị n'Ukpor dị n'okpuruọchịchị Nnewi South, Anambra state dịka Igwe Ụkpọr bụ dọkịta Felix Onyimadu si kwu.
  • Igwe Ukpor gwara BBC Igbo na ezigbo aha nna Peter Nwachukwu bụ Okekenwa.
  • O kwuru na ọ maghị ọtụtụ ihe gbasara Nwachukwu makana nwa amadi ahụ edenyeghị aha n'akwụkwọ ndị ụmụ nna nke o ji esonye n'ihe ha na-eme.
  • Peter Nwachukwu hụrụ nwunye ya n'ụlọụka ebe ọ ga-agụ egwụ ma mechaa lụwa ya dịka ejima Osinachi na nne ya si kọrọ BBC Igbo.