Egbughị m nwunye m Osinachi, ọ bụ kansa ngụ gburu ya- Peter Nwachukwu

Ebe foto si, Peter Nwachukwu/Facebook
Peter Nwachukwu, di Osinachukwu Nwachukwu,otiegwu ụka a ma ama agọọla na aka na ụkwụ ya adịghị n'ọnwụ nwunye ya ma sị na ọ bụ kansa ngụ gburu ya.
Peter kwuru nke a taa bụ Fraide n'ogige Ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị n'Abuja bụ ebe a kpụtara ya ịzara ọnụ ya n'ebubo na o tigburu nwunye ya.
gbe ndị uweojii kpụ ya na-aga n’ụlọ ikpe, ọ gwara ndị ntaakụkọ sị,
“Ataala m ahụhụ nke ukwuu maka ihe m na-emeghi,ndị mmadụ agbahapụla m.”
“ Ọ bụghị m gburu nwunye m, ihe gburu ya bụ ọrịa kansa nkụ(cancer of the lungs)”.
Nke a ka Peter nọ na-ekwu tupu a kpọba ya n’ime ụlọikpe ma mechie ụzọ.
Ụlọikpe etinyela Peter Nwachukwu na 'Kuje prison'

Ebe foto si, Peter Nwachukwu
Ụlọikpe ukwu dị n’Abuja n’ụbọchị Fraịde nyere iwu ka a Peter bụ di Osinachi Nwachukwu ka nọrọ na nga ruo mgbe a ga-anụ banyere ikpe ya n’ebubo igbu nwunye ya.
Ọkaipke N.K Nwosu nyere iwu a dịka Peter nọrọ n’ụlọikpe gọọ na aka ya adịghị n’ebubo iri na atọ (23) e boro ya.
Ọkaikpe sị ka ọ ka nọrọ na nga ma yigharịa ikpe ya gawa n’ụbọchị iri na isii na isi na asaa nke ọnwa Juun.
“Ihe e mere taa bụ ịkpụpụta ya n’ụlọikpe, a ga-ebido izo ileba anya n’ike ngwa ngwa” bụ ihe ọkaikpe Nwosu-Iheme kwuru.
“Ka ọ nọrọgodi n’ụlọ nga ‘Kuje Correctional Facility’ ruo mgbe a ga-eleba anya n’ikpe ya”.

Ebe foto si, Peter Nwachukwu/Facebook
- Peter Nwachukwu bụ di Osinachi Nwachukwu, ọgụ egwu ama ama ụwa na-akwara arịrị ugbua maka etu o si nwụ nso nso a.
- Nwachukwu bụ onye ụka na-aka ụka na Dunamis International Gospel Centre mabụrụkwa onye na-agbasa oziọma n'ụlọụka ahụ.
- Ọ bụ onye Ụboma dị n'Ukpor dị n'okpuruọchịchị Nnewi South, Anambra state dịka Igwe Ụkpọr bụ dọkịta Felix Onyimadu si kwu.
- Igwe Ukpor gwara BBC Igbo na ezigbo aha nna Peter Nwachukwu bụ Okekenwa.
- O kwuru na ọ maghị ọtụtụ ihe gbasara Nwachukwu makana nwa amadi ahụ edenyeghị aha n'akwụkwọ ndị ụmụ nna nke o ji esonye n'ihe ha na-eme.
- Peter Nwachukwu hụrụ nwunye ya n'ụlọụka ebe ọ ga-agụ egwụ ma mechaa lụwa ya dịka ejima Osinachi na nne ya si kọrọ BBC Igbo.









