Gịnị dị n'atụmatụ iwu ahụ ga-ebelata ụgwọ ụlọ n'Enugwu steetị na uru dị na ya

Fidelity Estate dị n'Enugwu steeti

Ebe foto si, ESHDC

Nkọwa foto, Fidelity Estate dị n'Enugwu steeti
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ndị na-achọrọ mmadụ ụlọ nke a na-akpọ 'agent' n'olu bekee na ndị ọkaiwu na-elekọtara ndị mmadụ ụlọ so na ndị na-ekwu ego ole a na-akwụ n'ụlọ.

Dịka onye na-achọ ụlọ n'Enugwu maọbụ na Naịjirịa, onye mbụ ha na-agakwu bụ ndị na-achọrọ mmadụ ụlọ.

Mana ọtụtụ n'ime ndị ahụ na-achọrọ mmadụ ụlọ na-agwa ndị na-achọ ụlọ ha ga-ebi ka ha debanye aha ha na-akwụkwọ maọbụ kwụọ ụgwọ dị iche iche.

Ọzọ bụ na ọtụtụ ndị na-achọ ụlọ wereike kwụchaa ego ahụ a sị ha kwụọ ma debanye aha ha n'akwụkwọ ndị na-achọrọ ha ụlọ mana emecha a gaghị enye ha ụlọ ọbụla.

Maka ịhazị ihe ndị a, ụlọomeiwu n'Enugwu steeti, wepụtara atụmatụ iwu ga-ahazị etu ndị na-achọrọ mmadụ ụlọ na ndị ọkaiwu na-elekọtara ndị mmadụ ụlọ ga-esi na-arụ ọrụ ha.

Onye wepụtara atụmatụ iwu ọhụrụ ahụ bụ Anthony Okey Mbah kọwaara BBC Igbo ihe iwu ahụ ga-akwụsị nakwa etu ọ ga-esi baara ndị Enugwu uru.

Anthony Okey Mbah bụ omeiwu na-anọchiteanya ndị Nkanu East n'ụlọ omeiwu n'Enugwu steeti.

Omeiwu Anthony Okey Mbah

Ebe foto si, Enugu govt house

Nkọwa foto, Omeiwu Anthony Okey Mbah

Ihe atụmatụ iwu ahụ ga-akwụsị

Akụkwụ iwu ọhụrụ maka ndị na-achọrọ mmadụ ụlọ, na ndị ọzọ
Nkọwa foto, Akụkwụ iwu ọhụrụ maka ndị na-achọrọ mmadụ ụlọ, na ndị ọzọ

Okey Mbah kwuru na ọtụtụ ihe dị iche iche iwu ọhụrụ ahụ chọrọ ịkwụsị gunyere ihe na-eme n'etiti ndị na-achọrọ mmadụ ụlọ, ego ndị ọkaiwu na-alekọtara mmadụ ụlọ na-ana, na ego onye nwe ụlọ na-anara onye na-achọ ụlọ ebe ọ ga-ebi.

N'okwu Okey Mbah "ihe iwu ọhụrụ a chọrọ ịkwụsị bụ ego ndị na-achọrọ mmadụ ụlọ (agent) na-amanye n'ụgwọ ụlọ maọbụ ihe ndị ọzọ ha na-anata ndị na-achọ ụlọ ha ga-ebi".

Ọzọ bụ "ego ndị ọkaiwu na-elekọtara ndị mmadụ ụlọ na-anara nke a na-akpọ 'agent fee' n'olu bekee".

Mbah sị na "Iwu ahụ chọkwara ịhazị ihe gbasara ego ndị nwe ụlọ na-anara ndị na-achọ ụlọ nke ha kpọrọ 'caution fee' na bekee."

"Ihe mere bụ na ọtụtụ ndị na-achọrọ mmadụ ụlọ ugbua n'Enugwu bụ ndị gọọmentị amaghị".

"Ndị ahụ na-achọrọ mmadụ ụlọ ga-apụta kwuo ihe ha chọrọ ka onye ha na-achọrọ ụlọ kwụọ ha, mana maka na ndị mmadụ amaghị ihe ha ga-eme, ha ga-akwụ ego ọbụla a gwara ha kwụọ; ọ bụ udiri ihe ndịa ka iwu ahụ chọrọ ịkwụsị".

Etu iwu ahụ ga-esi hazie ihe ndịa niile

Ụlọ omeiwu n'Enugwu steeti

Ebe foto si, Enugu state house of assembly / facebook

Nkọwa foto, Ụlọ omeiwu n'Enugwu steeti

Dịka Okey Mbah siri kọwaa "iwu ahụ ga-eme ka ndị niile na-arụ ọrụ ịchọrọ ndị mmadụ ụlọ debanye aha ha na ngalaba gọọmenti ga-ahụ maka ha".

Ọ sị na ndị na-achọrọ mmadụ ụlọ ahụ ga-eme ka ha nweta akwụkwọ ikike gọọmenti na-ahụ maka ya ga-enweputa.

Okey sị na nke ahụ ga-enyere ngalaba gọọmenti ahụ aka ịchịkọta ma hazie etu ndị mmadụ si arụ ọrụ ịchọrọ ndị ọzọ ụlọ.

"Ngalaba na-ahụ maka ụlọ obibi nwereike ijiri ohere a ma ọ bụrụ na atụmatụ a mechaa bụrụ iwu kpọkọta ndị ahụ niile na-arụ ọrụ ịchọrọ ndị mmadụ ụlọ ma nye ha ọzụzụ".

"Ha nwereike jiri aka ahụ hazie ego ụgwọ ụlọ na mpaghara dị icheiche na Enugwu"

Ọnọdụ atụmatụ iwu ahụ n'ụlọ omeiwu Enugwu steeti

Hon. Paul Nnajiofor / Facebook

Ebe foto si, Hon. Paul Nnajiofor / Facebook

Nkọwa foto, Hon. Paul Nnajiofor / Facebook

Onye weputara atụmatụ iwu ahụ bụ Okey Mbah kwuru na e weputara iwu ahụ nke mbụ n'ụlọ ndị omeiwu n'Enugwu.

Ọ sị na ya na-atụ anya na atụmatụ iwu ahụ wereike putakwa ọzọ nke ugboro abụọ ka ndị omeiwu tinye ya ọnụ n'oge ha ga-enwe nzụkọ n'ọnwa Maachị.

Cheta na a ka ga-enwe oge ndị omeiwu ga-akpọ ọhanaeze ka ha tinye ọnụ n'atụmatụ iwu ahụ tupuu e weputa ya n'ụlọ ndi omeiwu ugboro atọ bụ mgbe ha ga-eme ka ọ bụrụ iwu ma zigara ya gọvanọ Enugwu steeti bụ onye ga-ebinye aka na ya, nke ga-eme ka ọ bụrụ iwu zuru oke.

Usoro e ji eme ka atụmatụ a bụrụ iwu

Naịjirịa were usoro ndị omeiwu ji eme ka atụmatụ iwu banye n'akwụkwọ iwu ma bụrụ iwu zuru oke.

Ma na steeti ma gọọmenti etiti, naanị ihe dị iche bụ na e were ụlọ omeiwu abụọ na gọọmenti etiti bụ ndị sinet na ndị nnọchịtaanya.

A bịa na steeti lee usoro ndị omeiwu ga-eji mee ka atụmatụ iwu bụrụ iwu:

  • Ihe n'ile bụ ị weputa atụmatụ iwu
  • One omeiwu maọbụ ndị omeiwu abụọ ma karịa ga-akwado atụmatụ iwu ahụ
  • A ga-enweta ya ma gụpụta ya n'oge ọgbọkọ ndị omeiwu nke a na-akpọ '1st reading'.
  • A ga-agụpụta ya ugboro abụọ bụ mgbe ndị omeiwu niile ga-etinye ọnụ na ya.
  • A ga-ezuga ya na kọmittee ga-eme ka ọhanaeze na ndị ọnụ na-eru n'okwu gbakọo ma tinye ọnụ na ya.
  • A ga-agụ ya ugboro nke atọ bụ oge a ga-enyocha ihe niile kọmittii mere tupuu a ndị omeiwu atụọ vootu mara na ọ ga-abụ iwu maọbụ na a ga-ahapụ ya.
  • Mana ọ bụrụ na ndị tụnyere vootu ka atụmatụ iwu ahụ bụrụ iwu karịrị ndị na-achọghị ya; mgbe ahụ ka onyeisi ndị ụlọomeiwu ga-ekwupụta na ọ bụrụla iwu.
  • Mgbe ahụ ka ndị ụlọ omeiwu ga-enwega atụmatụ iwu ahụ ha kwadoro n'ụlọọrụ gọvanọ maọbụ onyeisiala ka ọ binye aka na ya.
  • Ọ bụrụ na Onyeisiala maọbụ gọvanọ binye aka na atụmatụ iwu ahụ, n'oge ahụ ka ọ ga-abụrụ iwu.