Ọ bụ eziokwu na ndị Igbo anaghị eresi ndị agbụrụ ọzọ ala? Lee ihe anyị chọpụtara

Okpokoro ala na ụlọ a na-arụ arụ

Ebe foto si, BBC/Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Akụkọ malitere ifesasị na soshal midia banyere ihe otu onye ntaakụkọ Arise TV bụ Reuben Abati kwuru banyere ndị Igbo bi na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa na usoro ha ji ere ala.

Abati n'emume o mere ihe n'ihe onyonyo TV n'izuụka gara aga kwuru na "ndị Igbo anaghị eresi ndị agbụrụ ọzọ ala."

Okwu nwamadị a butere nnukwu nrụrịtaụka n'etiti na soshal midia dịka ụfọdụ ndị kwuru na ọ bụ eziokwu ebe ndị ọzọ kwuru na ọ bụ asị.

Nke a mere BBC Igbo jiri malite ime nnyocha iji chọpụta nke bụ eziokwu kpọmkwem banyere okwu a Abati kwuru.

Na nnyocha ahụ, a gbara onye agbụrụ ọzọ nwere ala na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ajụjụ, gbaa onye na-ere ala a kpọrọ 'realtor' ajụjụ ma gbakwaa onye ọkachamaara n'omenala Igbo ajụjụ.

Enwere m ọtụtụ ala n'Enugwu steeti - Alhaji Nura

Okpokoro ala a na-achọ ibido rụwa ụlọ na ya

Otu nwoke, onye mpaghara Ugwu na-azụ ahịa n'Enugwu steeti bụ Alhaji Nura - si n'obodo Dutse, Jigawa steeti a na-etu aha dịka 'Dan Masanin nke Enugwu' gwara BBC na o nwere ọtụtụ ala na ụlọ n'Enugwu.

Nura kwuru na a mụrụ ya n'obodo Enugwu na o biela ebe ahụ ihe karịrị afọ iri isii (60yrs).

Mgbe a jụrụ usoro o jiri zụta ala ndị a, Nura kwuru na ọ raghị ya ahụ na ndị ọzọ ahụ ịzụta ala n'Enugwu.

"Ihe a na-ekwu bụ okwu ego, onye jide ego ọ zụrụ ala, onye na-ejighi ego agaghị azụnwu ala.

"Oge nnanna m ha bịara n'Enugwu, ọ zụrụ ala ma rụọ ụlọ, o nwere ụlọ ruru iri atọ n'oge ahụ.

"Ọ bụ mgbe ọ nwụrụ ka ụfọdụ ụmụ ya rere ụlọ na ala ha ketere ma laghachị na mpaghara Ugwu.

"Enwere m ọtụtụ ụlọ n'Enugwu, nke dị n'Ogui Road, ọzọ dị n'Owerre Road nakwa Ogidi street. Mana nke dị n'ama Awusa bụ nke m ketara n'aka nnanna m."

Nura kwuru na ọ bụghị eziokwu na ndị Igbo anaghị erersi onye mbịarambịa ala ma kọwaa na ihe gbasara ala bụ okwu ego.

"Onye Igbo chọrọ ire ụlọ ugbua, m jide ego, ọ ga-eresi m ya. Ọ bụrụ na ọ na-ere ụlọ ahụ otu narị nde naịra (N100m), m jide ego ahụ, ọ ga-eresi m ya".

O kwuru na ọ bụrụ ala dị n'ime obodo, na etu e si enwete ya bụ ị gakwuru ndị Eze ọdịnala.

Ndị na-ere ala a na-akpa oke agbụrụ?

Ndị na-arụ ụlọ n'obosara ala dị n'Enugwu

Onyebuchi Igboke bụ onye na-ere ala a na-akpọ 'realtor' n'Enugwu steeti gwara BBC na ọ bụ ihe mgbagwoju anya ịnụ na o were onye si n'agbụrụ ndị ọzọ chọrọ ịzụ ala a sị na-agaghị eresi ya ala maka agbụrụ ya.

N'okw ya "Ọ bụrụ na i nwere ndị na-abụghị ndị Igbo chọrọ ịzụ ala kpọta ha, ha ga-enweta ala".

"Dịka ndị na-ere ala e ji arụ ụlọ, enweghị mgbe anyị jị asị na anyị agaghị eresi onye ọbụla ala".

"Mana e nwere obodo ndị na-aju ajuju tupuu ha e ree ala, iji maara kpọmkwem agwa onye na-azụ ala ahụ.

"Ndi obodo dị etu ahụ nwereike iju ajuju si anyị "ọkwa ọ bụghị ka ị zụrụ ala ha ga resi ya ndị ga-enye ha nsogbu?".

Igboke kwuru na mgbe ọnọdụ dị etu ahụ na-apụta ihe bụ mgbe obodo na-enye ndị na-ere ala ikike ire mbara ala ha.

Mana e wepu ọnọdụ dị etu ahụ, onye ọbụla chọrọ ala ga-azụta ala na-enweghi ịkpa oke ọbụla.

Ihe omenala kwuru maka ire ala

Maazị Olueze Ukaejuoha bụ dibia anya nzụ nakwa ọkachamaara n'omenala Igbo
Nkọwa foto, Maazị Olueze Ukaejuoha bụ dibia anya nzụ nakwa ọkachamaara n'omenala Igbo

Otu onye ọkachamaara n'omenala Igbo bụ Maazị Olueze Ukaejuoha si n'obodo Duruagwu dị n'Okpuruọchịchị Ikeduru, Imo steeti kwuru na nke bụ eziokwu bụ anaghị ere ala ere n'omenala Igbo.

Olueze kwuru na "Ọ bụ ndị ọcha wetere ire ala, ndị Igbo anaghị ere ala ere, ha na-enye ala dịka onyinye maọbụ jiri ya kwụọ ụgwọ maọbụ gbazita ihe.

Ọ kwuru na ọ bụ n'ihi ego mere ka ọ dị ka a na-ere ala ere.

"Dịka onye dibịa ma bụrụ aka ji ọfọ, anaghị ere ala ere. Onye ọbụla sị na ya rere ala, ala ga-achụ ya ọsọ n'ihi na ala abụghị ihe nweta a na-ere ere.

"Ị pụtara ndụ ma hụụ ala. Naanị ihe ị ga-erenwu bụ ihe i nwetere. Ala bụ ihe nketa si n'aka ndị nnanna nnanna anyị.

Na nchịkọta, anaghị ere ala ere n'omenala Igbo kamgbe gboo, na-agbanyeghi agbụrụ onye ahụ si.

Mana n'agba ọhụrụ a, ọtụtụ ndị mmadụ na-erezi ala iji nwete ego, ha na-eresi onye ọbụla ala na-agbanyeghi agbụrụ onye ahụ si.