You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Isi mmili ji ọfọ, Achalugo, Ijele na aha ndị ọzọ di na nwunye na-etu onwe ha
- Onye dere ya, Chinonso Ugorji
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4
Omenala mba maọbụ obodo ọbụla agaghị ezu oke ma e wezuga ụdịrị aha ha na-aza.
Omenala bụ usoro obibi ndụ ndị mmadụ, nke pụtara njirimara ha. A gaghị ekwu okwu njirimara mmadụ ma e wezụga aha onye ahụ.
Nke a gosiri na aha bụ ihe dị ezigbo mkpa na ndụ mmadụ.
N'omenala Igbo, a na-agụ mmadụ aha dabere n'ọnọdụ dị iche iche.
N'oge gboo, ndị nne na nna na-agụ nwa ha mụrụ ọhụrụ aha dabere n'ụbọchị ahịa a mụrụ ya, iji maa atụ Mgbeke, Okorie, Mgbafọ, Okonkwọ, dgz.
Mgbe ụfọdụ ha na-agụkwa nwata aha site n'ihe mere n'ụbọchị ọmụmụ ya maọbụ ihe ndị ha gabigara tupu a mụọ ya, iji maa atụ Ọzọemena, Nwaọha, Ọbịanuju, Nwanyanwụ, dgz.
Ndị Igbo na-agụkwa nwa aha n'ihi olileanya ha nwere n'ọdịnihu, iji maa atụ Ọgadimma, Ogedi, Echidime, dgz.
Mana cheta na ọ bụghị naanị nwa a mụrụ ọhụrụ ka a na-agụ aha n'omenala Igbo. Di na-agụ nwunye ya aha ebe nwunye na-agụkwa di ya aha.
Ụfọdụ mgbe, aha ndị a bụ iji gosipụta ịhụnanya, ihe pụrụiche maọbụ onwunwe.
Mana oge ụfọdụ, ọ na-abụ iji rịọta ihe, iji wulite ugwu na nsọpụrụ nakwa iji jaa onwe ha mma.
Ọtụtụ ndị chere na ọ bụ naanị aha Bekee dịka Darling, Sweetheart, Honey, Baby, Babe, Daddy na Mummy ka di na nwunye nwereike iji medaa onwe ha obi, ma chefuo na e nwere ọtụtụ aha Igbo kara aka ndị ha nwereike iji 'suru ji na mmanụ'.
Ụfọdụ mmadụ kwuru na French bụ asụsụ ịhụnanya, mana edemede a ga-emepe gị anya ka ị hụ ihe omimi dị n'aha Igbo dị iche iche, ndị hụrụ onwe ha n'anya nwereike ịkpọ onwe ha.
Lekwa ụfọdụ aha a na-etu ụmụnwaanyị:
Achalugo – Achalugo bụ nwaanyị na-adịghị ka ibe ya. Ọ pụrụ iche ma na mma ma n'omume. E jighị ike ahụ nwaanyị dị etu a maka na ọ bụ ugo.
Akwaugo – Ihe a bụ aha nwoke na-etu nwaanyị iji gosi na o jighị ya egwuri egwu nakwa na o nweghị ihe ọbụla o nwere karịrị ya.
Asampete/Asa/Ọmalịcha - Nke a pụtara nwaanyị mara ezigbo mma, nwaanyị sitere na ntutu mara mma ruo n'ọbọụkwụ.
Nne – Nke a bụ aha nwoke na-etu nwaanyị ọ hụrụ n'anya nke ukwuu. Ihe ọ pụtara bụ na nwoke na-ahụtazi nwunye ya dịka nne mụrụ ya. Cheta na ịhụnanya dị n'etiti ndị nne na ụmụ ha ndị nke nwoke karịrị akarị.
Elelebe ejeghị ọrụ – Nke a pụtara nwaanyị mara mma dị egwu, mma na-enweghị atụ na mma na-aba n'anya.
Ụdara mmịcha – Ụdara bụ mkpụrụosisi mara mma ma dịkwa ọcha. Ụdara mmịcha bụ aha nwoke na-etu nwaanyị mara mma ma dịkwa ọcha.
Oriakụ/Odoziakụ - Ọtụtụ ụmụnwoke Igbo anaghị ekwe ka nwunye ha mee ihe ọbụla karịa ilekọta ụlọ, ụmụ na akụnaụba ha. Ọ bụ nwaanyị dị etu a ka ha na-akpọ Oriakụ maọbụ Odoziakụ.
Ugegbe oyibo – Ị makwa ihe ọ bụ ma a sị na mmadụ bụ ugegbe? Nke a bụ aha a na-etu nwaanyị dị ezigbo ọcha na nwaanyị mma ya na-amụke amụke.
Aha nwaanyị na-etu nwoke
Isi mmiri ji ọfọ - Nke a bụ aha nwaanyị na-etu nwoke o nyefechasịrị onwe ya. Ọ pụtara na nwoke dị etu ahụ bụ onye nwere nnukwu nsọpụrụ nakwa onye a na-atụ egwu.
Odogwu - Odogwu bụ aha a na-etu nnukwu nwoke, nwoke na-anaghị atụ egwu, nwoke bara ọgaranya na nwoke na-eme ihe anya na-ahụ.
Agụ/Dike - Nke a bụ maka nwoke gbasiri ike, nwoke na-elekọta nwunye ya na ezinaụlọ ya anya nke ọma nakwa nwoke na-enyeju nwunye ya afọ n'elu akwa.
Ugo - Nwaanyị na-akpọ nwoke ugo ọ bụrụ ma ọ chọpụta na omume nwoke ahụ adịghị ka nke ụmụnwoke ndị ọzọ ya na ha mekọrọ ihe. Nke a bụ maka na ugo bụ nnụnụ pụrụiche. E jighị ike ahụ ya.
Eze – Nwaanyị na-akpọ di ya aha a iji gosi na o nweghị nwoke ọzọ ga-enwe ikike n'ahụ ya nakwa n'ezinụlọ ya karịa di ya.
Omee ego – Nke a bụ nwoke na-anaghị emere ego ebere. Ọ pụta n'ọgbọ, ihe ike emewe.
Ekwueme/Akpọaza – Nke a bụ aha nwaanyị na-etu nwoke ọ tụkwasịrị obi. Nwoke na-anaghị agharịpụ, ọkachasị n'oge mkpa. Ọ pụtara na nwoke dị etu a anaghị agharịpụ na nkwa ọbụla o kwere.
Aha nwoke na nwaanyị nwereike itu onwe ha
Ndị a bụ aha nwoke maọbụ nwaanyị nwereike itu onwe ha. O nweghị ụdị ekere nwe ya.
Ha gụnyere:
- Ijele - Onye mara ezigbo mma, nwee ugwu na nsọpụrụ.
- Obi m – Onye ji ndụ ibe ya.
- Ụsọ m – Onye na-ewetere ibe ya obiụtọ na ọṅụ.
- Ịhụnanya m - Onye ihe ya na-amasị gị nke ukwuu.
- Nke m - Onye ị naghị eji egwurị egwu.
- Ọdị m n'obi – Onye ị naghị echefu echefu.
- Ụzọ obi m - Nke a pụtara na ọ bụ naanị onye a na-etu aha maara ihe na-amasị onye na-etu ya aha.
Ụfọdụ bụkwa site n'aha onye ahụ na-aza
- Nọọnọọ - Chinọnso/Chinọnyerem
- Ifii - Ifeanyị/Ifeọma
- Emii - Chukwuemeka
- Chizi - Chizitere
- Ọlịị - Ọlụchi/Ọlụchukwu
- Okee - Okechukwu
- Iyke/IK - Ikechukwu
- UC - Uche
- Amịị - Chiamaka/Nwamaka/Nneamaka/Ụzọamaka
- Ezii - Ezinne
- Deraa - Chidera