Akụkọ dị mkpa - Julaị 9, 2025
Akụkọ dị mkpa - Julaị 9, 2025

Isi akụkọ taa na-arụtụaka n'etu mba Amerịka si wepụta usoro 'Visa' ọhụrụ metụtara ọtụtụ mba nakwa Naịjirịa na ihe ndị ọzọ dịka ihe gbasara akara JAMB ụmụakwụkwọ ji abanye mahadum.
Lee akụkọ dị mkpa taa ahụ na nkenke:
- Ngalaba na-ahụ maka ihe na-eme n'obodo na mba Amerịka ewepụtala usoro ọhụrụ ga-ebelata etu esi enye akwụkwọ njem 'visa' n'ọtụtụ mba nke gụnyere Naịjirịa.
- Iwu akwụkwọ njem ọhụrụ a, nke ngalaba ahụ kwuru na ọ ga-amalite ozugbo, ga-emetụta visa abụghị maka ndị mbịarambịa na visa abụghị maka ndị nnọchiteanya.
- Gọọmenti Naịjirịa ekwuola na akara otu narị na iri ise ga-abụ akara Joint Admission and Matriculation Board (Jamb) ụmụakwụkwọ ga-eji banye Mahadum n'afọ a.
- Minista na-ahụ maka agụmaakwụkwọ bụ Maruf Olatunji Alausa kwupụtara na gọọmenti weturu afọ ole ụmụakwụkwọ ji abanye Mahadum site na afọ iri na asatọ ruo afọ iri na isii.
Soro anyị n'ọbaozi Whatsapp chanelụ ka ị gụọ akụkọ ndị a n'uju.






