Ihe asatọ gbara ọkpụrụkpụ Elon Musk gwara BBC

Akajiakụ ma bụrụkwa onye nwe ụlọọrụ Tesla na Twitter bụ Elon Musk na BBC nwere mkparịtaụka.
Musk ji ohere a tinye ọnụ maka ọkwu akpụ n'ọnụ kamgbe gbasra etu o si arụ ọrụ dịka onyeisi ụlọọrụ Twitter na ihe ndị ọzọ.
Musk zụtara Twitter n'ọnụ ego ijeri dọla anọ n'afọ 2022.
Kamgbe ọ zụtara ya, ọtụtụ ihe agbanwela nke butere okwu.
Lee ihe asatọ gbara ọkpụrụkpụ ọ gwara onye ntakụkọ BBC
Ihe asatọ gbara ọkpụrụkpụ Elon Musk gwara BBC

- "Ugbua ọnụ ọgụgụ ndị ụlọọrụ Twitter dị ihe dịka mmadụ 1500, na mbụ ọ fọrọ obere ka ha ruo 8,000".
- "O fụrụ m ụfụ ịchụ ndị a n'ọrụ, kama ma anyị emeghị ya ụlọọrụ a gaara ịda ụbịam".
- "E chere m na m kwesịrị ị na-echeba ozi m uche tupu m zipụ ya".
- Na ha ga-agbanwe etu ha kpọrọ BBC ụlọọrụ gọọmentị ji ego akwado ka ọ bụrụ ụlọọrụ ndị ọha ji ego akwado.
- O kwuru na Twitter ebidola ịnweta ego dịka ndị ji ha achụ nta ahịa alọghachiwela nwayọ nwayọ
- Enweghị onye o ji aka ya chụọ n'ọrụ
- Musk kwuru na akụkọ asi ebeletala na Twitter kamgbe ọ banyere n'oche dịka onyeisi. O kwuru na ọ bụ mbọ iwepụ igwe adịgboroja na ihe ndị ọzọ butere nke a.
- O kwuru na ha ga-ewepụ akara na-acha anụnụ anụnụ e ji ama akara ndị akwadoro na ngwụcha izuụka a.
Musk ji ijeri dọla 190 bụrụ onye nke abụọ kacha nwee ego n'ụwa niile.




